Etu Gwomgworo si dagbuo ihe karịrị mmadụ atọ n' Ojuelegba

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ebe niile dara jụụ n'abali abụọ gara aga n'Ojuelegba nke dị na Legọs steeti ebe gwongworo bu osisi si n'elu akwa daa n'elu ụgbọala atọ.

Foto dị ịcheiche na-agagharị na soshal midia na-egosi ebe osisi kwọrịrị ụgbọala ndị so na ihe mberede a.

Ndị ọrụ gbata gbata na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihe mberede a bụ atọ mana ndị hụrụ mgbe ihe a mere nọ na-ekwu na ọnụọgụgụ ahụ ga karị atọ.

Eburu kwara ụfọdụ ndị mmadụ gaba ụlọọgwụ ị nata ọgwụgwọ ebe amabeghị ọnọdụ ndụ n'ọnwụ nke ha so na ya.

Ndị mmadụ, ọ kachasị ndị ntorobia na-egosi iwe ha maka ihe mberede a, na-ekwu na ọ bụ ihe enwereike ịgbochi ma ọ bụrụ na gọọmentị na-arụ ọrụ ka ha si kwesi.

Ha kwuru na ebe ihe yiri nke a mebụrụ mbụ na gọọmentị ekwesila ị me ihe ị hụ na ihe a agaghị eme ọzọ.

@KingNomso kwuru na ugbua abụghị mbụ ihe a na-eme

@cchukwudebelu sị na ọ bụ anya erụghị ala gọọmentị butere nke a

@MrNosegbe kwuru na ebe ihe ruru otu ụbọchị gachara ndị gọọmentị ka gbachị nkịtị

@AustinYugo dọrọ aka na-achị Legos steeti bụ Akinwunmi Ambode aka na ntị maka nkịtị ọ dịka ọ gbachiri gbasara owku a