You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ụmụnwaanyị ga-ebido ịnya ụgbọala na Sawudi Arebia
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a
Ipob chọrọ ka a tọghapụ Abaribe
Ndị otu IPOB etinyela ọnụ n'ihe gbasara nwụchi omeiwu Enyinnaya Abaribe.
Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Emma Powerful kwuru sị na ọ bụ maka ihe gbasara IPOB ka e ji nwụchie ya, maka na gọọmentị etiti na-achọ ịgbọchi ndị Igbo ọnụ. O kwuru sị tọghapụ ya ozugbo ozugbo.
Nkwado Inec maka ntuliaka 2019
Onyeisi ndị otu INEC bụ Mahmood Yakubu, akpọkuola ndị ntaakụkọ mba ofesi ka ha bịa soro tinye anya n'ihe gbasara ntuliaka a ga-eme na 2019.
Ụmụnwaanyị Sawudi Arebia
Ihe ọma emeelara ụmụ nwaanyị na mba Sawudi Arebia.
Bido taa gawa n'ihu, ha ga-ebido ịnya ụgbọala dị ka ụmụnwaanyị ndị mba ọzọ, ka Eze Salman na-achị ha buliri iwu ruru ọgụ afọ mere ka ha bụrụ naanị mba fọrọ n'ụwa ụmụnwaanyị anaghị anya ụgbọala.
Nke a so n'ihe ọgbara ọhụrụ ọkparaeze ha bụ Mohammed bin Salman webatara iji gbanwee etu e si ebi ndụ na mba ha.
N'egwuregwu,
Ọ ga-akpọtụ n'Iko Mbaụwa taa ka Ịngland ga-ezute Panama, ebe Japan ga-ezute Senegal.
Poland na Kolombia ga-akụkọtakwa mpi taa iji mata ndị ga-agafe na agba mgbapụ.
Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a
Ihe nkiri nke taa
Otu nwoke na-esi ofe gosiri akaọrụ ya ebe a.