You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Bọjetị 2018: Ihe ụmụ Naịjirịa na-ekwu maka ebubo onyeisiala
Mana ụmụ Naịjirịa na-etinyekwa ọnụ ha na ya bụ okwu n'igwe mgbasaozi twitter ebe ha na-egosi etu o si emetuta ha ma na-ewe ha iwe.
Onyeisiala binyere aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu Naịjirịa nke afọ 2018 ụnyaahụ ebe ọ kpoputara ndị omeiwu ụkwụ n'ama na-ebo ha na ha wepụrụ ego ọrụ ya.
Ọ gara n'igwe twitter depụta ihe niile e wepụrụ mana ụmụ Naịjirịa ji agwa a gwara ọgwa anabata ya bụ ihe o kwuru.
Ebe ụfọdụ kelere ya na-ekwu na ha ahụla na ndị omeiwu bụ ndị iro ọchịchị onye kwuo uche ya, ndị ọzọ na-ajụ ihe kpatara o jiri binye aka n'akwụkwọ ahụ ebe ọ bụ na ọ mara na o nwere nsogbu.
Oluyemi Fasipe kwupụtara nke a na twitter ya;
Adebayo Bankole Akintunde na-ajụ ihe kpatara na ndị a-akatọ ọchịchị Buhari anaghị ekwu okwu gbasara nkatọ e mere na bọjetị ahụ.
Ikechukwu n'akụkụ nke ya kwuru ka a kụọrọ onyeisiala aka na o binyere aka na bọjeti n'ọnwa Juun.
Mustafa Ramalan kwuru na ọ dịka ndị omeiwu chọrọ ịrapụta onyeisiala site n'iwetu ego dị na bọjeti mana onyeisial wụrụ ha n'ala site n'okwu ya oge o binyere aka na ya bụ bọjeti
Mana Stanley Nwabia tinyere ọnụ n'okwu a were kwuo na ọ bụ awụwọ ka Buharị na-awọgbụ ndị South East maka etu o si na-atụ aka na mbepụ emere na ego akwa Naịja nke abụọ na ọdọ ụgbọelu n'Enugwu.
Mana Oluwole Dada na ata ndị omeiwu ụta maka ego ndị a akpara aka.
Christian Chukwu kwenyere n'ihe Dada kwuru, ma si na o bu ịgbagwoju ndị mmadu anya ka onyeisiala chọro ime.
Onye ọzọ akara ya bụ @Mr_JAGs na-ajụ ma Buhari ọ gụrụ akwụkwọ Bọjeti a maọbụ mmadụ gụrụ ya gwa ya.
@SimplyTEEWHY sị na nchọpụta ya na-egosi na onyeisisala amaghị etu ọrụ ọdọ ụgbọelu Enugwu rur tupu ozipụ Bọjeti a.
Ndị ụlọomeiwu kwuru na ha ga-ekwu ihe mere ha jiri mee ihe ha mere na bọjeti mana ugbua, ụmụ Naịjirịa ka nọ n'etiti na-ajụ onye eziokwu dị n'ọnụ, Onyeisiala ka ọ bụ ndị Omeiwu.