You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Bọjetị 2018: Ego akwa Naịja na ihe asaa ndị na-esere Buhari na ndị omeiwu
Ndị isi ụlọomeiwu etiti; Bukola Saraki na Yakubu Dogara anọghị oge onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'Bọjetị 2018 n'obi gọọmenti n'Abuja.
Okwu Buhari kwuru mgbe o mere mbinye aka mere ka ọtụtụ mmadụ na-eche na esemokwu ha akala njọ.
Onyeisiala gosipụtara n'okwu ya, na-ezoghị ọnụ ọbụla, na ihe adịchaghị mma mmekọrịta ụlọọrụ ya na ndị ụlọomeiwu.
Nke a pụtara ihe dịka Buhari boro ndị omeiwu ebubo ịmapụ ego na ọrụ ga emetụta ndị mmadụ ma tinye ego na nke metụtara ha.
Lee ụfọdụ ebubo ndị a dịka o siri wepụta ha n'igwe Twitter ya:
1 . Mbepụ n'ego maka ịrụ akwammiri Naịja nke abụọ, ụlọọrụ ọkụ Mambila, okporo ụgbọoloko Ajaokuta nakwa okporoụzọ Bonny-Bodo, Lagos-Ibadan nke o boro na ha bepụrụ ijeri N11.5bn.
2. Mbepụ n'ego maka ịrụ ụlọ ọdọugboelu n'Enugwu nke ndị ụlọomeiwu mere ka o si ijeri naira abụọ (2bn) gbadata na nde N500 nke onyeisiala kwuru ga-eme ka e nwee ndọghachi azụ na nrụcha ọrụ ahụ.
3. Mbepụ ijeri naira ise (N5bn) n'ego a mapụtara maka ịkwụ ụgwọ ezumike nka na nhazigharị ụgwọ ndị ọrụ bekee nke o kwuru ga-emetụta mkparịtaụka gọọmenti na ndị ọrụ Naijiria.
4. Mbepụ ego maka mmalite Maritime University na Delta steeti nke ndị ụlọomeiwu mere ka o si ijeri Naira ise (N5bn) gbada na ijeri atọ na ụma (N3.4bn).
5. Mbepụ ego ruru ijeri asaa na ụma (7.5bn) n'ego maka nhazigharị ụlọọgwu ukwu nakwa iwu ebe nleta ọrịa kansa na ịzụ ọrịa ọgwụ maka nleta ọrịa akịrị.
Mana dịka ha bepụchara ego n'ọrụ ga-emetụta ọha, ndị ụlọomeiwu tinyere ihe n'ọrụ nke gbasara ha .
6. Ha manyere ijeri 14 na ụma (N14.5bn) n'ego Bọjeti nke ụlọomeiwu naanị. O si ijeri N125 gbalite rue N139.5.
7. Ha fanyere ọrụ 70 n'ọrụ Mịnịstri na-ahụmaka ọkụ, ọrụ na ụlọ obibi, iji nwee ohere tinye okporoụzọ ọhụrụ ha mapụrụ ego n'ọrụ ụzọ dịka oke mkpa.
Mana n'ọsịsa ha ndị sineti kwuru na ọ bụ ka Bọjeti ahụ dị oge o rutere ha aka mere ka ha kpa ya aka.
Osote onye ndu Sineti bụ Bala Na'allah, kwuru " Ọ bụ ọrụ ndị ụlọimeiwu ilebanye ma hazigharia bojeti."
Cheta na nke a abụghị mbụ Buhari boro ndị ụlọomeiwu ebubo ịmanye ihe nke a kpọrọ budget padding na bekee.
Na afọ 2016, gọọmenti etiti boro ụlọ omewiwu ebubo tinye ijeri N481 n'ego bọjetị afọ ahụ.