You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Juun 12: FFK, Fayose, nwa Abiola kwadoro ihe Buhari mere
Amaghị ha dịka ndị enyi onyeisiala Muhammadu Buhari, mana aka na-achị Ekiti steeti bụ Gọvanọ Ayo Fayose na onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Fani Kayode kwadoro mgbanwe Buhari mere ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya.
Ụbọchị Wenesde bụ Juun 6 2018, Gọọmenti etiti Buhari nọ n'isi ya higharịrị ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya site na Mee 29 ga Juun 12 iji kwanyere MKO Abiola bụ onye e chere na o meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala na Juun 12 nke afọ 1993 ugwu.
Fani-Kayode toro Buhari maka nke a sị "A na m ekele Buhari maka ịma ọkwa na Juun 12 bụzị ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya ọhụrụ. "
O kwuru: "Ihe a bụ ihe kwesịrịla ka e mee kemgbe ma tụkwa m n'anya.
"Ana m ekele ya maka ịkwanyere MKO Abiola, onye meriri na ntuliaka onyeisiala e mere na Juun 12 afọ 1993 site n'inye ya nzere GCFR. Nke a bụ nnukwu ihe!"
N'okwu ya, Gọvanọ Fayose kwuru na MKO Abiola kwesiri nkwanyere ugwu nke mere na ndị Ekiti kwanyeere ya ugwu site na ime ụbọchị Juun 12 ụbọchị ezumike na steeti ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na nkwanye ugwu kachasị e nwere ike inye Abiola bụ ikwanyere iwu ala anyị ugwu na ime ka ntuliaka ghara inwe wuruwuru maọbụ magomago ọbụla.
Nwa MKO Abiola bụ Hafsat Abiola-Costello sokwa na ndị tinyere ọnụ n'ihe a mere.
N'ozi o wepụtara, Abiola-Costello kwuru na ime Juun 12 ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya ọhụrụ, ma nyekwa MKO nzere GCFR, Kingibe GCON nakwa Gani GCON n'otu ụbọchị, na-egosi "obi m gbawara agbawa na ịkwụwa aka ọtọ, inye onye oke ruru ya, nakwa nkwanyere ugwu, ka dị ndụ n'ala ndị mụrụ m ji ndụ ha chụọrọ aja."
Ọ gara n'ihu sị: "Onweghị mkpụrụ okwu nwere ike ịkọwapụta udị afọ ojuju na ọṅụ m nwere. Ana m ekele Chineke na m dị ndụ hụ taa."
Akụkọ ga-amasị gị: