Abakaliki Fire: Ụgbọala asatọ na ụlọọrụ anọ gbara ọkụ n'ọdọ

Ọkụ gbara ọdọ ndị ọrụaka ụgbọala n'Abakaliki ụnyaahụ.

Otu onye na-arụ ọrụaka mekanik na ya bụ ọdọ aha ya bụ Sylverster Okemmiri kwara BBC ihe a n'ụtụtụ a.

Dịke o kwuru, "ọkụ a nke gbara n'isi ụtụtụ ụnyahụ gbara ihe dịka ụlọọrụ anọ na ihe ruru ụgbọala asatọ gwogwo ".

Cruz Nwachi bụkwa otu n'ime ndị na-arụ ebe ahụ sịrị na na-ezie ha enwere ọgbaaghara gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'ime ha mana odoghị ya anya ma ọ bụ ya kpatara ọkụ ọgbụgba a.

Nwachị sị na ndọrọndọrọ a, nke ọ si na ọ bụ ndị gọọmenti bụtere site na-itinye onyeisi nke ndị otu ha anabataghị, bụ ihe butere ọgbaagha n'ime ha.

Mana ha amaghị ka ọnwere ka o si gbasa ọkụ a gbara.

Ka ọ dị ụgbụa ndị otu ahụ nọ n'ọgbakọ itinye ọnụ n'ihe kpatara ya bụ ọkụ ọgbụgba.

Akụkọ kachasị taa: