You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abalị a: Ọgbụnigwe egbuola ndị uweojii na kwa Russia 2018 fọrọ abali asatọ
Akụkọ kachasị n'abalị a
Ọgbụnigwe agbuola ndị uweojii ala Kenya ise
Ogbunigwe agbagbuola ndị uweojii mba Kenya ise oge ụgbọala ha nya na okporoụzọ metụtara ogbunigwe na mba Somalia.
Akụkọ kwukwara na mmadụ atọ ọzọ meruru ahụ.
Ụlọikpe ekpeebiela na Buhari anaghị ekwupute ụgwọ ọ kwụrụ n'ụlọọgụ
Ụlọikpe ukwu dị n' Abuja ekpebiela na onyeisiala Muhammadu Buhari ekwesighị igosi ọnụ ego ọ kwụrụ dịka ụgwọ ụlọọgwụ nke ọ natara n'ala Briten n'afọ gara aga.
Cheta na ọ bụ otu kpọrọ onwe ha 'Advocacy for Societal Rights Advancement and Development Initiative' na bekee bụ ndị gbara Buhari akwụkwọ ahụ.
Stella Oduah abaala Apga
Onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Stella Oduah ahapụla otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP gawa APGA.
Akụkọ na-abata n'ehihie a kwuru na ọ bụ onyeisi otu APGA bụ Victor Oye bụ onye nabata Odua n' isiụlọ ọrụ a n'Abuja
Emeriela otu Super Eagles ọzọ
Otu egwuregwu Czech Republic ejirila otu ọkpụ na asataghị ihe merie otu Super Eagles n'asọmpị enyi na enyi ha agbara taa na mba Austria.
Ọ bụ Thomas Kalas bụ onye nyere goolu a n' elekere iri abụọ ni ise na agba nke mbu.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri anyị taa
Gụọ akụkọ ndị ọzọ