Juun 12: Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọọmenti etiti ehigharịala ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya ka ọ bụrụ Juun 12.

Juun 12 ga-anochi Mee 29 bụ ụbọchi onye chịburu Naijiria bụ Olusegun Obasanjo hiwere maka ncheta ọchịchị onyekwuoucheya.

Onyeisiala Muhammadu Buhari onye kwupụtara nke a n'akwụkwọ o depụtara na Twitter kwuru na nhịgharịa ahụ gbanyere ụkwụ n' na Juun 12, afọ 1993 ụbọchị ndị Naijiria gosipụtara uche ha site na ntuliaka bụ nke e chere bụ nke kachasị gaa nke ọma n'ala Naijiria nke mgbe ala anyị jiri nwere onwe ya.

O gara n'ihu kwuo na a ga-enye MKO Abiola, onye meriri na ntuliaka ahụ nturuugo GCCFR, nyekwa onye ya na ya soro zọọ ọkwa onye isiala ahụ bụ Baba Kingibe ga-enweta nzere 'GCON, ebe ọkaiwu ama ama bụ Gani Fawehinmi nwụrụ anwụ ga-enwetakwa nzere 'GCON'.

"Dịka o kwesiri, Ka e mechara mkparịtaụka, Gọọmenti Etiti ekpebiela na bido taa gawa, Juun 12 ga-abụzi ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya.

"Ya mere, gọọmenti ekpebiela inye MKO Abiola nwụrụ anwụ bụ onye meriri na ntuliaka ahụ a kagburu akagbu nturuugo kachasị n'ala anyị bụ nturugo, 'GCFR'.

´Onye ya na ya soro zọọ dịka osote onyeisiala bụ Baba Kingibe ga-enweta nzere 'GCON'.

"Onye lụrụ ọgụ maka ikike dịịrị onye, Juun 12 nakwa ọchịchị onyekwuoucheya bụ Gani Fawehinmi nwụrụ anwụ ga-enwetakwa nzere "'GCON.'"

Ihe ụfọdụ ha kwuru na Twitter:

Mana dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-eto Buhari maka ihighari ụbọchị ahụ, ndị ọzọ kwuru na ọ bụ mbọ iji mee ka obi ndị ndị Yoruba mma dịka ntuliaka 2019 na-abịa nso.

Kayode Ogundamisi kwuru na isi Olusegun Obasanjo ga-enwuru ọkụ ma Juun ọ kpọrọ asị bụzị ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: