Gbasaanụ ozi kwụọtọ -Buhari

Tata bụ ụbọchị eji echeta ndị ọrụ mgbasa ozi na mbaụwa niile.

Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari jikwa ohere a ekwe ndị ọrụ mgbasa ozi na Naịjirịa nkwa na ọ gaghị na-esonye aka na otu ha sị arụ ọrụ ha.

Buhari yọkwara ha ka ha na-agbasa ozi ziri ezi.

Isiokwu ncheta ndị ọrụ mgbasa ozi na mbaụwa niile nke arọ 2018 bụ "I lebanye anya na mmefusi ikike,ikpe kwuọtọ nakwa nhatanha iwu.

O si n'ọnụ onye na-enye ya ndụmọdụ n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Femi Adesina wee na-atụghari uche na isiokwu a.

Buhari kwuru na-ekwesi mkwa ike na ya ga-ahụ na anaghị emegide ndi ọrụ mgbasa ọzi na Naịjirịa ma ha na-arụ ọrụ ha.

N'ọnụ ya ndị ọrụ mgbasa ozi mara amara na anyị ga-edowe okwu anyị,mana anyị chọrọ ka ha gbasa ozi kwụọtọ,gbara ndị mgbasa ozi na-achọ ị bute ọgbaghara n'obodo ọsọ.

Onyeisiala sị na o kwetekwara na ndị mgbasa ozi ziri ezi na-ebute ọganiru n'obodo mana ọ ga-adimma ka ndị ji ya bụ ọrụ ebute ọgbaghara chegharịa.

Ọ dọkwara aka ntị gbasara ntụliaka na-abia na 2019,na-ayọ ka ndị mgbasa ozi gbasa ya n'ụzọ kwụọtọ n'agbanyeghị onye ọbụla so na ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: