Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Biafra Zionists Federation na Ipob na-ama aka
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Ụmụaka bụ Olileanya Naịjirịa - Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Dịka taa bụ ụbọchị ncheta ụmụaka na Naịjirịa, Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola ndị ọrụ nchekwa, ezinaụlọ, ndị isi obodo nakwa nke okpukperechi ka ha bilie buo agha megide mwakpo ụmụaka bụ nke na-arị elu.
Buhari kwuru na ụmụaka bụ ọdịnihu Naịjirịa, na-atụmatụ si n'aka ha na-enye ya owuweanya na Naịjirịa nwere ndịnihu dị mma.
Biafra Zionists Federation akachapụla iwu ị nọ n'ụlọ Ipob na MASSOB

Ebe foto si, Getty Images
Dịka Ipob na MASSOB enyela iwu ka ndị mmadụ nọọrọ n'ụlọ n'abalị iri atọ nke ọnwa Mee, iji cheta ndị Biafra nwụrụ na-agha
Otu kpọrọ onwe ha Biafra Zionists Federation kachapụrụ iwe a ma gwa ndị mmadụ ka buru ọkọlọtọ Biafra gawa n'Enugwu iji kwupụta mwereonwe Biafra.
Akụkọ mba ofesi;
Saụt Korịa agbarala Not Koria akaebe

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Saụt Korịa bụ Moon Jae-in ekwuola na ogbo ya nke Nọt Korịa bụ Kim Jong-in chọrọ ịkpọchapụ ngwaagha nuklịa n'ogige Korịa peninsula.
Moon Jae-in kwuru na ọ maghị ma mba US ọ ga-ekwenye na mkpebi a, kama ka ha nụrụ ya site n'ọnụ Kim.
N'egwuregwu;

Ebe foto si, Getty Images
Akwa dara n'ọgbọ egwuregwu dị na Kiev n'abalị mgbeReal Madrid jiri goolu ato asatara otu merie Liverpool n'agba ikpeazụ asọmpi Uefa Champịọns
Mmeri a ga-eme ya ugboro atọ n'ụsoro ma bụrụ ugboro iri na atọ n'oge niile Real Madrid na-amabute iko a.
Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:











