Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Trump na Jong-Un a ga-ezukọ?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Rochas agaghị apụ APC

Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha, ekwuola na ọ gaghị eji maka onye ọbụla pụọ na pati ya bụ APC maka na o so na ndị bidoro ya na steeti ahụ.

O kwuru nke a ka akụkọ na-agagharị na ya bụ Rochas chọrọ ịlaghachị otu APGA bụ ebe ọ nọbu.

'Naịjirịa nọ n'ọgbaghara'

Onye nchịkọta ndị ụka katọlik niile nọ n'Abuja bụ Archbishop John Onaiyekan, ekwuola na Naịjirịa nọ n'ọdụ ọgbaghara maka ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na mba a.

O kwuru nkea ka ọ na-aka ụka akwamozu maka mmadụ iri na itoolu gụnyere ndị fada abụọ ndị a na-enyo bụ ndị ọchiehi gburu na Benue n'ọnwa Epreelụ.

Nzukọ Trump na Jong-Un ọ ga-enwe isi?

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na nzukọ ya na onyeisiala Nọt Korea bụ Kim Jong-Un nwere ike ghara ịbịa na mmezu.

O kwuru na e nwere ọnọdụ ndị ha chọrọ mana ọ bụrụ na ha enwetaghị ha, nzukọ ahụ agaghị eme.

O kwukwara na omume Kim Jong-Un agbanweela kamgbe ha kwenyere inwe ọgbakọ a.

N'egwuregwu

Ndị bọọlụ na-amasị toro ndị Super eagles ike n'agbanyeghị na ndị otu Atletico Madrid ji ọkpụ atọ asatara abụọ merie ha n'asọmpi enyi na enyi a gbara n'Uyo ụnyaahụ.

Gee ya na nkeji nke ututu a:

Lee ihe nkiri taa