Ohaneze ekwuola ihe ha chọrọ ka e mere ha na akụkọ ndị ọzọ dị mkpa n'ụtụtụ a
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Ihe ndị Ohaneze chọrọ
Ndị Ohaneze Ndịgbo ewepụtala ihe ha chọrọ ka e mere ha.
Ha bụ: otu agba ọchịchị afọ isii maka onyeisiala na ndị gọvanọ.

Ka e kepụtakwuo otu steeti na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa
Ka ekpochapụ atụmatụ okpuru ọchịchị ma kwụsị ihazi akụnaụba steeti ndị nwere onyinye Chukwu.
Lai Mohammed abịala ọzọ
O kwuru na a na-achọ ihe ruru tarị naịra asatọ n'ọma furu n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan

Ebe foto si, Getty Images
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Lee webusait e ji nde naịra 64 we hazie

Ebe foto si, OSGF Website
Ụlọọrụ odeakwụkwọ Naịjirịa ji nde naịra iri isii na ise wee wulie webusait ha.
Akụkọ mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
A ga-aka ụka ncheta maka ndị nwụrụ n'ogbunigwe a tụrụ na Manchester mba UK n'afọ gara aga.
Cheta na mmadụ iri abụọ na abụọ nwụrụ ebe ọtụtụ ndị ọzọ meruru ahụ n'ogbunigwe ahụ Salman Abedi tụrụ.
N'egwuregwu
Onye nkuzi ọhụrụ otu egwu bọọlụ Arsenal

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwu bọọlụ Arsenal akwadola iwebata Unai Omery dịka onye nkuzi otu ahụ.
N'aka nke ọzọ, ndị otu egwu bọọlụ Athletico Madrid eruola Uyo maka asọmpi enyi na enyi ha na Super Eagles ga-agba taa n'ọgbọ egwuregwu Godswil Akpabio.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:











