Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Massob achọghị ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ na Mee 22
Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:

Ọgụ na mgba aghasaala congress ndị APC mere n'Enugwu taa.
Ndị uweojii ji egbe na gas anyammiri chụsaa ndị mmadụ ka ha bidoro ime ngagharị iwe n'ọgbakọ e mere iji họpụta ndị ọhụrụ ga-achị na APC.
Ha bidoro mkpamkpa maka na ha sị na ha ahụghị aha ha n'akwụkwọ INEC ji.
Ebe ọzọ na Naịjirịa

Ebe foto si, AFP
Ndị otu MASSOB ajụla na agaghị eme "onye ọbụla nọrọ na be ya" n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee a.
Fred Onyenaucheya bụ onyeisi ndị MASSOB n'Abia saụt kwuru na ndị mmadụ kwesịrị ịpụta n'igwe bịa nwere aṅụrị kama ịnọ n'ụlọ .
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Ụbọchị 19 nke ọnwa Mee bụ nke ụfọdụ ndị mmadụ agaghị echefu ọsịsọ, maka na ọ bụ ụbọchị Ọkparaeze Harry lụrụ Meghan Markle bụ onye na-eme ihe nkiri na mba Amerịka.
Ọlụlụ ha kpalitere ụka n'ụfọdụ ebe maka na nne Meghan bụ onye isi ojii.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Reuters
Ndị otu Chelsea na Manchester United ebidola egwu anyị ga-ama onye ike ga-agwụ iji mata onye ga-ebuli iko FA nke afọ a.
Onye ọbụla meriri n'etiti ha ga-ezute Manchester City ma afọ ọhụrụ bido, iji mara onye ga-ebuli ihe nrite akpọrọ community shield.
Gee nkeji anyị na mgbede a:
Ihe nkiri taa
Violet J kwuru na ọ nọ n'ụra mgbe ara ya bịara fagide ya n'olu chọrọ ị fagbu ya.
Mana o tiri mkpu ma bilie, ya bụrụ ara ya bịara fachie ya na nkọlọ na-ekweghi ya kuru ume.













