You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Agbapeela ụlọọrụ ọhụrụ EFCC n'Abuja taa
Onyeisi ụlọomeiwu nta nke Naijiria bụ Yakubu Dogara so na ndị bụ ndị ọbịa pụrụiche na-emume ahụ.
N'emume a kwa, Onyeisiala Buhari bụ onye ji aka ya chabie eriri ejiri gosi na ebe ahụ bụ ụlọ ọhụrụ na obodo Wuse n'Abuja.
Lee ụfọdụ foto na-egosi mgbape a na soshal midia:
Ndị mmadụ katọrọ akụkọ kwuru na ejiri nde naira iri abụọ na ano were rụọ ụlọọrụ ahụ na-ekwu na ego ahụ karịrị akarị.
Ebe onyeisi ha bụ Ibrahim Magu na-ekwu si kelee ya n'ihi na ezigbo ọnụ ụlọọrụ ọhụrụ ahụ kwesiri ị bụ naira ijeri narị.
N'akụkọ metụtarụ nke a, ndị mmadụ ebidola ị manye Magu ọzọ n'elu soshal midia.
Ihe bụ nke a bụ na ọ pụtara n'ime ihe onyonyo ebe o yi okoloto bu ihu onyeisiala Buhari.
Onye malitere itinye ọnụ n'okwu a bụ onye nwere akara @DemolaRewaju na Twitter, bu onye dere na ọ dịka Magu kwụnyere Buhari na ntụlịaka na-abịa.
@I_am_Anomeli na ekwu na nke a gosiri na ọ na ọ kwunyere onyeisiala Buhari na ndị otu ya tụmadụ ugbua ihe ntuliaka 2019 na-adị njikere dị ka onye a siri kwuo
@Itiroro kwukwara na EFCC na onye ndu ya kwesiri ị bụ ngalaba kwụrụ onwe ha
Ndị ọzọ si na o kwesiri ị kwụrụ onwe ya n'ihi ọkwa ọ nọ na ya iji gosi n'aka ya kwụ ọtọ.
Magụ kọwakwara n'ime ihe onyonyo ahụ e gosiri na Channels TV na ọ kwunyere onye ọ bụla na ọ sọsọ ihu Buhari dị n'okoloto ahụ o yi na ọ nweghị ihe ọzọ so ya.