You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
MASSOB ebola gọọmentị etiti ebubo ịgbasa ozi alakụba
Onye ndu otu na-achọ nwereonwe Biafra a kpọrọ BIM n'aha ịchafụ bụ Ralph Uwazururike ekwuputala uche ya maka oke ogbugbu na-aga na mpaghara ugwu Naịjirịa.
O si na ihe butere nke a bụ na gọọmentị etiti na-achọ ị gbasa ofufe alakoba na gburugburu Naịjirịa ga-eme ka ọ ghọọ mba ụka alakoba.
Onye na-ekwuchitere otu BIM bụ Mazi Chris Mocha kwuru nke a ebe a na-eme emume nturugo Anaocha emere n'Ọnịcha.
N'ọnụ ya "Cheta na ihe yiri nke a mere n'afọ 1811 mgbe e gburu onyendu ndị Yoruba na Kwara steeti ma nara ọchịchị ebe ahụ rue ugbua".
Ọ sị nke a gosiri na mwakpo ahụ na-eme na Benue, Taraba na Nassarawa bụ ihe yiri ihe a na-achọ ime ọzọ.
O ji kwa ohere ahụ ị gwa ndị Igbo ha kpachara anya ma dịkwa njikere n'ihe gbasara nchekwa onwe ha.
Ọ sị "ọ bụ ndị Igbo ka ọgbaaghara si n'ọgụ ofufe na-emetụta karị...ya mere ha ga-eji saa anya mmiri n'usoro a ị gbanwe Naịjirịa dịka mba ụka alakoba".