You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị igwe mmadụ agbaala nwa Naịjirịa ọkụ na Sawụtụ Afịrịka
A gbaala nwa Naịjirịa ọzọ ọkụ n'obodo Rustenburg dị na mba Sawụtụ Afịrịka dịka igwe mmadụ ahụ a gbasịrị ụgbọala ya ọkụ.
Onyeisi otu ụmụ Naịjirịa bi na Sawụtụ Afịrịka bụ Adetola Olubanjo kwuru nke a.
Ihe a mere ọhụrụ a na-egosị na agha ndị mmadụ na Sawụtụ Afịrịka na-ebuso ndị Naịjirịa bi n'obodo ha.
Ndị uweojii na Sawụtụ Afịrịka ekwukwala na ihe ahụ mere bụ eziokwu ebe ha kwuru na e nwere ebe abụọ ndị a na-amaghị gbara ụgbọala ọkụ.
Ha kwuru na n'otu nime ụgbọala ahụ a gbara ọkụ, otu nwoke gbalahụrụ ha mana o merụrụ ahụ nke ukwuu dịka a kpọrọ ya ọkụ mana o mesiri nwụọ n'ụlọọgwụ.
Ogbugbu a na-abịa n'ihe na-erughi mkpụrụ ụbọchị iri e gburu ThankGod Okoro n'obodo Florida West Rand dị na Johanisbọg.
Ndekọ na-egosi na e gbuola ụmụ Naijirịa ruru mmadụ 117 na mba Sawụtụ Afịrịka kamgbe ọnwa Febuwarị afọ 2016.