You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Saụt Koria agbanyụọla igwe mgbasaozi ga Nọt
Dịka mkparịtaụka mba abụọ ahụ bụ nwanne ma bụrụ kwa ndị iro na-abịa nso, mba Saụt Koria agbanyụọla igwe mgbasa ozi echiche ha dị n' agbata ha na Nọt Koria.
Saụt Koria nwere ọtụtụ igwe mgbasa ozi n'agbata ha na Nọt Koria nke ha na-akpọ egwu ha na akụkọ na-akatọ Nọt Koria nke ndị agha Nọt Koria na ndị nkiti bi nso nwere ike ịnụ.
A maghị ma Nọt Koria aga agbanyụ igwe mgbasa ozi nke ha. Ha na-akpọkwa akụkọ na-akatọ Saut Koria na ndi enyi ha.
Dịka ozi ụlọọrụ ntakụkọYonhap kwuru na ọs i n' ngaalaba Mịnịstrị nchekwa ala ahụ, mba Saụt Koria mere nke a iji belata obiọkụ dị n'etiti ndị agha mba abụọ ahụ iji nye ohere maka ịkpa udo."