Akụkọ kachasi n'abalị a: E zurula ọfọ ndị Sineti

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'abalị a

Mkpa mkpa kpara n'ụlọ ọrụ Sineti taa

Otu onye sineti achụrụ n'orụ Sịnetọ Ovie Omo-Agege kpọrọ ndị agboro baa n'ịme ụlọọrụ Sineti ga buru ọfọ ha.

Ndị uweoji anwuchiela ya ebe ndị sinetị nyere ha na ndị agha otu ụbọchị iji chọta ọfọ ahụ.

Na mba Africa,

Goomentị Zimbabwe achụọla ndị nọsụ puku iri maka ị gba abụbọọrụ ha na-eme iji gosi iwe ha maka ụgwọ orụ eji ha.

Ndị nọsụ ahụ kwuru na ha anụla mana abụbọrụ ha ga aga niru.

Mana Gọọmentị a ga-ege ntị?

Komishona na-ahụ maka oke gbasara nwaanyị na India bụ Swati Maliwal jisiike na-akwụ agụ nrị maka nwaakpo na ogbugbu emere nwata nwaanyị dị afọ asatọ.

Ọ na-eme nke a iji mee ka uche gọọmentị ha dị na oke mwakpo ụmụnwaanyị na-aga biga na mba India.

Na akụkọ egwuregwu

Uche Nwofor na Ugonna Uzochukwu edenyela aha n'otu egwurewgu bọọlụ bụ Enugu Rangers FC. Nwofor na Uzochukwu bụ bụ ndị gbara otu supa egus bọọlụ na asọmpị CHAN.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa

Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji

Ihe nkiri nke taa