Emela emume icheta 'Things Fall Apart' ka ọ gbara afọ 60

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akwụkwọ a Chinua Achebe dere bụ akwụkwọ nyochara omenala ndị Igbo mgbe ha nọ n'ọchịchị ndị ọcha.

E bipụtara ya mbụ n'afọ 1958 ma rekwa ihe karịrị nde iri n'abụọ n'ụwa niile. E degharị kwara ya n'asụsụ karịrị iri ise nke mba uwa niile n'asụ.

I ji kwanyere ya ugwu maka ncheta ụbọchị ebipụtere ya, ndị na-eme ihe onyonyo na ndị edemede gbakọrọ gụọ akwụkwọ a n'ụlọ emụme Southbank na London

Ben Okri bụ onye odee akwụkwọ nwere ntụliugo dị icheiche so kwa n'ọgụgụ a

Ọ gụrụ isi mbido akwụkwọ ahụ ebe a:

Chibundu Ọnụzọ bụ onye odee akwụkwọ ọzọ nọ ebe ahụ sị na akwụkwọ a bụ akwụkwọ pụrụiche

Ọ sị "I wenyia akwụkwọ a, ọ ga ahịa gị ahụ ị tọgbọ ya tupu ị gụcha ya"

Ndị gara ebe e mere emume a na-egosi aṅụrị ha na soshal midia: