NCC: Telelogy ga-egosirịrị na ha ma ọrụ

Ngalaba na-ahụ maka ikwu okwu n'igwe nke a kpọrọ Nigerian Communications Commission (NCC) na bekee, ekwuola na ịkwụ nde dọla $500 apụtaghị na Teleology Holdings, ụlọọrụ nwere isiọma ịbụ ndị ga-azụ 9mobile kama na ha ga-egosi na ha nwere nka ịrụ ọrụ etu a gaghị emegbu ndị mmadụ.
Osote onyeisi NCC bụ Umar Danbatta, gwara ndị ntakụkọ na Legọs ụbọchị Mọnde na naanị ma ha nyochaa ụlọọrụ nwetara ohere ịzụ 9mobile, ma hụ na ha ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara ọrụ ikwu okwu n'igwe ka a ga-enye ha ikike iweghara 9Mobile.
Danbatta ekwughị ihe ga-eme ma ọ bụrụ na nyocha ahụ gosi na Teleology amaghị ọrụ.
Cheta na Teleology meriri ụlọọrụ ekwenti dịka Bharti Airtel, Globacom na Alheri nke Dangote nwere, iji nweta ikikere ịzụ 9Mobile.
Teleology kwụrụ nde $500 bụ ego mbụ dịka ụlọọrụ nwere isiọma ịbụ ndị e nyere ikike izụ 9mobile.
9mobile nwere nsogbu kemgbe ụlọọrụ si Middle-East bụ Etisalat wepụrụ onwe ha n'ụlọọrụ ekwentị ahụ nke mere ka ha gụgharịa aha ha 9mobile.
Akụkọ kwuru na Teleology si na Keystone Bank kwụọ nde $500, ebe United Capital Trustees Ltd na United Bank for Africa (UBA) Plc ga-erite uru na ya.

Akụkọ ga-amasị gị:










