E liri dike Biafra bụ Joe Achuzia n'abalị

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Akwa m ozu Joe Hannibal Ajuzie

A ga-edowe ahu dike Igbo jiri jee mba bụ Joe Oseloka Hannibal Achuzia na ala echi.

N'elekere iri na abuo (12:00 am) nke isi ututu ka a ga-eli ya na obi ya dị na Idum ojeyi, umuezeyi n'Asaba.

Ụmụakwụkwọ Chibok 15 n'ime 112 eji eji bụ ihe ka dị ndụ

Ozị na-eru BBC ntị ekwuola na ọ bụ nanị mmadụ iri na ise (15) fọrọ ndụ na mmadụ otu narị na iri na abuo (112) ụmụakwụkwọ Chibok a ka ji eji.

Ahmed Salkida bụ onye so na ndị gara okwu maka ịtohapụ mmụaka ahụ kwuru nke a.

Mana ọnụ na-ekwuru gọọmenti Naịjirịa sịrị na ha ka nwere olile anya na ụmụagbọghọ niile ndị ahụ ga apụtacha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Onyeisiala mba Rọshịa akọọla ogbunigwe agbara na mba Sirịa

Onyeisiala mba Russia Vladimir Putin ji obi iwe katọọ ogbunigwe a ndị US, UK na France turu na Syria n'isi ụtụtụ a.

Ndị mba ahụ ji ogwunigwe ndị ahụ atụrụ wee dọọ Syria aka na ntị maka ngwagha kemịkal ha ji gbuo ndi be ha n'izu gara aga.

N'egwuregwu

Nkeji nke mgbede a

Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.

Ihe nkịrị nke taa

Ihe onyonyo a gosiri ahụhụ ndị ụmụaka bụ ụmụ ndị China na-ata na Ghana.