You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kedụ ihe a ga-eji ego Abacha zuru mee na Naịjirịa?
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Ihe onyonyo taa
Kelechi Amadi-Obi bụ onye ose foto ama ama gwara anyị n'ime onyonyo a, ihe ị kwesiri ị ma, ma mee maọbụrụ na ị chọrọ ka ị dịka ya dika onye osefoto.
Ncheta ikpeazụ Achuzia
Nnia Nwodo bụ onye isi Ohaneze ndị Igbo gwara ụmụ dike Biafra bụ Joe Achuzia ka ha gbaa mbọ hụ na ha soro nzọụkwụ nna ha.
O kwuru nke a ka e mere emume ncheta ikpeazụ Achuzia n'Asaba ụnyaahụ.
A ga-eli Achuzia echi n'Asaba.
Ego Abacha zuru
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwenyela na onye chịbụrụ Naịjirịa bụ Sanị Abacha, zuru ọtụtụ ego.
O were Buhari afọ iri ikwenye ma kwupute site n'ọnụ ndị mịnịstrị na-ahụ maka akụnaụba, na nde dọla narị atọ na iri abụọ na abụọ ($322.5) ndị mba switzerland nyeghachịrị Naịjirịa so n'ego Abacha zuru.
Cheta n'afọ 2003, gọọmentị kwukwara na a hụrụ ego Abacha zuru, nke ruru nde dọla iri abụọ na abụọ ($22m).
Akụkọ ndị ga-amasị gị
N'akụkọ mba ofesi
Ndị mba Rọshịa adọọla mba Amerịka aka na ntị maka ibido agha n'etiti mba ha abụọ.
Ha kwuru na ọ bụrụ na Amerịka si n'elu tụọ ha ogbuniigwe, ma wakpoo ha maka ebubo eboro ha maka iji ngwaagha kemịkal gbuo ọtụtụ mmadụ na Siria, na agha nwere ike ibido n'etiti ha.
N'egwuregwu
Naịjirịa nwetara otu Ihe nrite n'egwuregwu commonwealth ụnyaahụ, nke mere ka nchịkọta ihe nrite ha bụrụ iri na abụọ ugbua.
Ebe otu Arsenal ji mkpokọta ọkpụ isii asatara atọ gbapụ ndị CSKA Moscow n'asọmpi Europa League.
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.