Ipob: Mpụtagharị Buhari ga-enye anyị Biafra

N'ụbọchị taa, Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwupụtala obi ya ị zọ ọkwa ọchịchị ọzọ n'afọ 2019.

Nkwupụta ya butere ọtụtụ ọsịịsa site n'ọnụ ndị mmadụ dị icheiche, ụfọdụ bụ ndị katọọrọ ya dịka ndị ọzọ kwuru na ọ bụ ihe o kwesiri i mee.

Mgbe BBC Igbo gbara Ụkọchukwu Innocent Chukwudi Peace bụ onyeisi mgbasa ozi otu chọrọ nwereonwe na Naịjirịa bụ Ipob ngalaba dị n'Abuja ajụjụ ọnụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

O kwuru na ọ bụ ihe ọṅụ nye ndị Ipob n'ihi na Chineke ji ọchịchị Buhari e mee ka nwereonwe Biafra bịa na mmezu.

O kwuru na ọ bụrụ onye ọzọ na-akpọghị ndị Igbo asị dịka Buhari bara n'ọchịchị, onye ahụ nwereike i mee ka obi daa jụọ ndị Igbo nke ga-eme ka ndị Igbo chefuo na ha bụ ohu na Naịjirịa.

Peace kwuru "Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na "Pharoah" ahụ ga-anọ n'ọchịchị gaa n'ihu, dịka Obasanjo kwuru na Naịjirịa ga-ekewa ma ọ bụrụ na Buhari baa n'ọchịchị."

"Ekpere anyị n'ụtụtụ, ihihie na abalị bụ ka Naịjirịa gbasa sịa" Peace kwuru.

Gere okwu ụkọchukwu Peace ebe a;