You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasi n'abalị: Ụzọ ị ga-eji gbochie ọrịa ịba lasa
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Ụzọ iri ị ga-eji gbochie ịba lasa
Ndị ọrụ ahụike kwuru na ihe na-ebute lasa fiva bụ oke, site na mmamịrị ma ọ bụ nsị ya, ya mere:
1.Debe gburugburu gị ọcha, ekwela ka oke bịa nso na be gị
2.Erila ihe ọbụla oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị
3.Were ihe na-egbu nje hichaa gburugburu ebe oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị
4.Onye ọbụla ahụ ọkụ na-eme, kpọrọ ya ga n'ụlọ ọgwụ
5.Kpuchi onwe oge ị na-emetu onye ahụ na-adịghị aka
6.Mara etu isi ekwe ndị mmadụ aka
7.Mechie ebe niile nwere ohere oke nwere ike isi bata n'ụlọ gị
8.Ahụ rịa gị, ga n'ụlọ ọgwụ
9.Jiri ncha na mmiri na agba agba kwọcha aka gị oge niile.
Otu anụ eju ji bụrụ ihe na-akwalite ọbara ọcha nwoke bụ 'sperm'
Ma anụ adighị, azụ adịghị, ogbenye na-aba n'ọhia kpara ejula, were sie nri.
Ogaranya, enwebughị efe ejula mgbe mbụ n'ihi na, dịka ndị Igbo ji ya ekwu okwu, ahụhụ dị na imecha ejula.
Ma ugbua, iji ejula isi nri bụzị akara ejiri mara ọgaranya n'ihi oke ọnụ ahịa ya.
Ejula bụ ezi nri nwere proten, calcium, selenium, magnesium ma na-enye ọbara n'akwa ịkwalite ọbara ọcha nwoke bụ 'sperm'.
'Mahadum Covenant kpụrụ ụmụakwkwọ isi dara iwu'
Ndị mmadụ jisike na-egosi iwe ha n'elu atụmatụ mgbasa ozi nke a kpọrọ Twitter maka akụkọ pụtara ebe otu mahadum bu Covenant kpụrụ ụmụakwụkọ ha isi.
Ụmụakwụkwọ a na-ekwu na ihe kpatara eji kpụ ha isi bụ maka na ha ejighi akwụkwọ nsọ ga na chapụl ha n'ime ụlọakwụkwọ ahụ.
Otu onye ọkaikpe bụ Precious Nwankwo gwara BBC Igbo na ndị isi n'ụlọakwụkwọ ahụ dara iwu na-ahụ maka nchekwa oke ruru mmadụ.
Gee ntị ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju:
'Anwụrụ bụ nsi nye ụmụaka na Zimbabwe'
Otu na-ahụ maka ugwu ruru onye bụ Human Right Watch ekwuola na ụmụaka na-arụ ebe a na-esi anwụrụ na Zimbabwe nọ na nsogbu iheizendụ.
N'akụkọ ha akpọrọ Bitter Harvest, otu a kwuru na ụmụaka na-arụ ebe ahụ iji kwụọ ụkwọ akwụkwọ ha na-arịa ọrịa ịgbọagbọ
N'akụkọ egwuregwu
Ọ ga-adị kpọkpọ n'abalịa dịka ụmụafọ Naịjirịa abụọ ga-ezute onwe ha n'asọmpị Uefa Europa.
Ndị a bụ Alex Iwuobi nke Arsenal na Ahmed Musa nke CSKA Moscow dịka otu abụọ ahụ ga-ezuko.