You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nwanyị bu egbe emerụọla mmadụ ato ahụ n'isiụlọọrụ YouTube
Ndị uweoji na mpaghara ugwu California ekwuola n'otu nwaanyị bu egbe emerụọla mmadụ atọ ahụ n'isiụlọọrụ na-emepụta ihe onoyonyo a kpọrọ Youtube tupu o gbuo onwe ya.
Ndị ntaakụkọ na mba Amerika enye la aha nwanyị a ka Nasim Aghadam ma kwukwa na ọ bụ esemoku ezịnaụlọ kpatara mwakpo a
E chere na otu nwoke so na ndị merụrụ ahụ ụnyahụ bụ enyi ya nwoke ụlọọrụ, CBS na-ekwu.
Umu nwaanyị abụọ dị afọ 32 na ọzọ dị 27 merụrụ ahụ na mwakpo a.
N'agbanyehi nke a ndị ntaakụko na-ekwu, ndị uweoji ekwụpụtabeghị ihe nwaanyị ji buru egbe wakpo ndị mmadụ na Youtube.
Ndị ọrụ na Youtube kọwara ihe na-eme n'elu igwe okwu:
Aghadam bụbu onye na-emepụta ihe onyonyo na Youtube katọrọ Youtube n'oge gara aga maka ọ sị na ha na-akpachị ihe onyonyo ya.