Nwanyị bu egbe emerụọla mmadụ ato ahụ n'isiụlọọrụ YouTube

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị uweoji na mpaghara ugwu California ekwuola n'otu nwaanyị bu egbe emerụọla mmadụ atọ ahụ n'isiụlọọrụ na-emepụta ihe onoyonyo a kpọrọ Youtube tupu o gbuo onwe ya.

Ndị ntaakụkọ na mba Amerika enye la aha nwanyị a ka Nasim Aghadam ma kwukwa na ọ bụ esemoku ezịnaụlọ kpatara mwakpo a

E chere na otu nwoke so na ndị merụrụ ahụ ụnyahụ bụ enyi ya nwoke ụlọọrụ, CBS na-ekwu.

Umu nwaanyị abụọ dị afọ 32 na ọzọ dị 27 merụrụ ahụ na mwakpo a.

N'agbanyehi nke a ndị ntaakụko na-ekwu, ndị uweoji ekwụpụtabeghị ihe nwaanyị ji buru egbe wakpo ndị mmadụ na Youtube.

Ndị ọrụ na Youtube kọwara ihe na-eme n'elu igwe okwu:

Aghadam bụbu onye na-emepụta ihe onyonyo na Youtube katọrọ Youtube n'oge gara aga maka ọ sị na ha na-akpachị ihe onyonyo ya.

Akụkọ ga-amasị gị