You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Anthony Joshua emeriela n'ọkpọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:
Ndị uweojii Enugwu steeti anapụtala ndị mmadụ egbe karịrị otu narị
Ndị uweojii n'Enugwu steeti kpokọtara egbe gụnyere AK47, double barrel, nakwa pump action Iji rube isi n'iwu onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Ibrahim Idris nyere gbasara ịchịkọta egbe dị n'aka ndị nkịtị.
Onye kọmịshịọna ndị uwe ojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed gosiri ndị ntaakụkọ egbe niile ndị ahụ, nke o kwuru na ha napụtara ndị mmadụ iji wee chekwaa ndụ na akụnaụba ndị ala anyị.
Egbe na ngwa ọgụ ndị ahụ gụnyere; Ak 47 iri, pump action iri na atọ, pistol otu barrel iri atọ na atọ, double barrel iri atọ na isii, egbe mkpụmkpụ ebere ọnụ asatọ, revolver atọ, baretta pistol iri na otu, egbe ogologo otu barrel iri na asatọ, ngwo ngwo egbe ndị ọzọ, nakwa mgbọ egbe mejuputara ọnụọgụgụ.
Uche Secondus na Lai Mohammed na-akwata
Onyeisi otu pati PDP bụ Uche Secondus enyela mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed ụbọchị abụọ iji kwugharịa ebubo e boro ya maọbụ ọ gbaa ya akwụkwọ.
Mohammed boro Secondus ebubo na ọ natara nde narị abụọ n'ụlọọrụ onye ndụmọdụ n'ihe gbasara nchekwa n'afọ 2015.
Na mba ofesi
Mba Russia na ndị nnupuisi n'obodo ọdịda-anyanwụ Ghouta dị na Syria ekwekọrịtala na ha ga-achili aka elu.
Aka a ha chiliri elu ga-enye ohere ka e nwee ike si n'obodo Douma bupu ndị merụrụ ahụ ma nwekwaa ike ịga n'obodo ndị ọzọ.
N'egwuregwu
Nwaafọ Naịjiria na-anọchite anya ndị Britain bụ Anthony Joshua meriri n'ọkpọ 'world heavyweight' ọ kụrụ.
Joshua meriri Joseph Parker bụ onye New Zealand n'ọkpọ ha kụrụ n'isi ụtụtụ taa.
Mmeri a o meriri, nyere ya ihe nrite WBO, nke mere ka o soro na ndị na-akụ ọkpọ nwere ihe nrite WBA, IBF nakwa WBO nke ndị agba heavyweight na mbaụwa.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji
Ihe nkiri nke taa
Kedụ ndị kwesịrị iyi isiagụ
Ishiagụ ọ na-ekwesi ụmụnwaanyị ka ọ bụ nanị ụmụnwoke kwesiri ị na-eyi ya?