Na Kenya a wala otu onye ekwesighị isi

Ebe foto si, AFP
Ọ na-akpọtụ akpọtụ na mba Kenya n'otu nnukwu ụlọgwụ, Kenyatta National Hospital ebe ndị dọkịta na-awa ahụ wara otu onye ekwesighị ahụ.
Dịka akụkọ onye ntaakụkọ BBC nọ na Nairobi bụ Anne Soy, siri kwuo, a kwusịla dọkịta na ndị nọọsụ mere nke a ọrụ n'ike.
Nke a bụ nnukwu nghakọ ndị na-arịa ọrịa enwerela n'obodo ahụ.
A kwabatara mmadụ abụọ na-arịa ọrịa na amaghị onwe ha n'ụlọọgwụ ụbọchị ụka; otu nwere mkpụkọ ọbara n' ụbụrụ, nke ọzọ nwere ebe zara aza n'isi ya.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:
E kweresịrị iwepụ mkpụkọ ọbara ngwangwa kama a wara isi onye nke nwere ebe zara aza n'isi ya.
Ọ bụ mgbe dọkịta wara isi ahụ ka ọ ghọtara nzọghe ahụ ha mere.
Onyeisi ụlọọgwụ ahụ kwuru na ọnye ahụ awara isi na-adị mma ma kwukwa na nyocha na-aga n'ihu.
Mana ndị dọkịta nọ n'ụlọọgwụ kwụnyere onye otu ha n'azụ. ha na-asị ndị isi ụlọọgwụ nye onye ọ dịri ịkwadọ ma nye ndị ọria akara jị mata onye bụ onye.
Ngalaba nyocha ọrụ ahụike dị n'aka kwuru na nke a bụ mbụ a na-enwe ụdị nghakọ na mba Kenya. Ha enyela ụlọọgwụ ahụ iwu ka ha nye akwụkwọ nkọwa ihe mere, ebe kwuru na ha ga-eme gbatakwuoọnụgi banyere ya.









