Gọọmenti akagbuola nzukọ FEC nke izuụka a

Onyeisiala Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Buhari bụ onye isi ndị ọchịchị so na FEC

Agaghị eme nzukọ ndị ọchịchị Naịjirịa a na-akpọ 'Federal Executive Council' (FEC) nke izuụka a.

Onye na-ekwuchịtere onyeisiala Buhari bụ Femi Adesina gwara ndị ntaakụkọ taa,na onyeisiala bụ Muhammadụ Buhari na ọtụtụ mịnịsta ya ga- eje mmeme a ga-eme na Transcorp Hotel dị na Abuja na Wenesde bụ ụbọchị ekwesiri ime nzụkọ a.

Adesina kwuru n'akwụkwọ mgbasaozi o zipụru sị,"Nzukọ FEC agaghị adị na ụbọchị Wenesde, ọnwa Febụwarị 28, nke afọ 2018."

Ndị ọchịchị so na FEC mbe ha no na nzukọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nzukọ FEC bu ebe ndị ọchịchi na anọ ahazị ọchịchi obodo

"Ọ bụ maka na onyeisiala na ndị mịnịsta ya nwere nnukwu mmeme nke a kpọrọ 'International Conference on Lake Chad Basin,' n'ụlọ nkwari, Transcorp Hilton, dị n'Abuja.

Ha ga-anọ ogologo oge ebe ahụ."

Ndị ọchịchị gọọment a na-akpọ FEC na-agbakọ kwa Wenesde n'Abuja. Ndị na-eso na ọgbakọ a bụ ndị mịnịsta, ndị gọvanọ na ndị chibụrụ Naịjirịa dị ka onyeisiala.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ