You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anwụchiela mmadụ atọ maka 'ozuzu ụmụaka' n'Imo steeti
Kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Chris Ezike, a gwala BBC Igbo na akụkọ ndị mmadụ na-akọ na-atọrọ ụfọdụ ụmụaka n'obodo Umuowa-Ibu dị n'Okigwe, bụ akụkọ ụgha.
O kwuru na ọ bụ ozuzu ka ezuru ụmụaka ahụ na ọbụghị ntọ.
Ọ sị na ndị otu ya anwụchiela mmadụ atọ gbasara ya bụ ozuzu ụmụaka a.
N'agbanyeghị na akụkọ kọrọ na atọrọla ụmụaka ndị ahụ n'ọnwa Disemba gara aga, Ezike kwuru na-anwụchiri ha n'ime ọnwa Febụwarị a.
Nke a na-abịa ka ụfọdụ ụmụnwaanyị obodo a mere ngagharịiwe iji gwa ndị uweojii megharịa ahụ chọta ụmụ ha atọ na-efu efu.
Ndị ntaakụkọ kọrọ sị na ndị Umuowa-Ibu boro ndị uweojii ebubo nrụrụaka, sị na ha na-ana ha ego ma ha gaa ime mkpesa n'ụlọọrụ ha.
Ezike kwuru sị n'iji gosi na onweghị nrụrụaka dị n'ebe ndị uweojii nọ dịka ndị ntaakụkọ si kwuo, na ụfọdụ ndị obodo Umuowa-Ibu bịara nleta otuobi n'ụlọọrụ ya Ụnyaahụ.