You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Okada Ban: Etu Legọs steeti siri machie Okada ịgba na steeti ahụ maka nwoke agbara ọkụ
Kọmịshọna ndị uweojii na Legọs steeti bụ Abiodun Alabi akọwala n'ụbọchị Tọọzde bụ ụbọchị 19 nke ọnwa Mee ndị iwu ọhụrụ steeti ahụ wepụtara maka ndị na-anya ọgba tum tum agaghị emetụta.
O kwuru na iwu a aghaghị emetụta ndị ji ọgba tum tum ebu ngwo ngwo ndị mmadụ nakwa ndị na-anaghị eji ọgba tum tum ebu ndị njem.
Legọs steeti tiri iwu machiri ndị ọgba tum tum a na-akpọ ndị 'Okada' ịgba n'okpuru ọchịchị isii na steeti ahụ nke gụnyere Ikeja, Surulere, Eti-Osa, Lagos Mainland, Lagos Island, na Apapa.
Etu e siri kugbuo ma gbaa nwaokorobịa na-emepụta egwu ọkụ na Legọs maka ebubo esemokwu ego njem (N100)
Ndị uweojii na Legọs steeti anwụchịela mmadụ anọ ndị a na-enyo maka ebubo iso ndị gbakọtara kugbuo ma mụnye otu nwaamadị dị afọ 38 na-emepụta egwu ọkụ.
Ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ ihe esemokwu a dapụtara n'isi ha maka okwu ego njem merụrụ ahụ nke ukwuu ma gbalahụ ọnwụ dịka ndị uweojii gbapụtara ha, nwaamadị a ihe ọdachị tara isi ya bụ onye ọtụtụ maa dịka David.
N'ihe onyonyo pụtara ọhụrụ na soshal mida, a hụrụ ebe igwe mmadụ gbakọtara ọnụ na-eti ụfọdụ ndị ntorobịa ihe ma mecha mụnye otu n'ime ha nke ha jiboro ọkụ.
Akụkọ na-ekwu na ndị mere ihe a bụ ndị na-anya ọgba tum tum na-egbugharị ndị mmadụ nke ọtụtụ ma dịka ndị ọkada na Legọs.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC Igbo na ha anwụchịle mmadụ anọ a na-enyo n'okwu ọnwụ nwaokorobia a.
E kwukwara na ihe kpatara esemokwu a dapụtara n'akụkọ a bụ okwu ego njem otu narị naịra (N100).
Alabi gara n'ihu kwuo: "Anyị ga-eme nnyocha ịma ma Okada ndị kwuru na ha na-ebu ngwo ngwo ndị mmadụ abụ n'ezie ma na-abụghị aghụghọ"
O kwukwara na ndị nwere ọgba tum tum pụrụiche nke a na-akpọ 'power bike' nwereikike igagharị na Legọs steeti.
Mmachi ọhụrụ so ogbugbu e gburu otu nwa okorobịa ma gbaa ya ọkụ na akụkụ Lekki, Legọs maka esemokwu dapụtara n'okwu ego njem (N100).
Gọọmentị Legọs steeti kwuru na ha mere mmachi a iji belata ọgbaghara na-adapụtakarị n'isi ndị mmadụ na ndị Okada nakwa iji wegachịte nchekwa na steeti ahụ.
Nke a abụghị ịzịzị gọọmentị Legọs steeti na-eji maka nchekwa amachị ndị Okada mana Alabi kwuru "imanye iwu a n'agba ọhụrụ a ga-abụ nke kpụ ọkụ n'ọnụ ma dị ezigbo ire"
Kedụ ka okwu a siri dapụta?
Otu anya hụrụ ihe a mee kpọrọ onwe ya Philip kwuru na ya bụ okwu dapụtara n'ụbọchị Tọọzde, bụ ụbọchị 12 nke ọnwa Mee, 2022.
Ihe a mere n'akụkụ Admiralty Way, nke Lekki Legọs.
Otu enyi Philip ma bụrụkwa onye na-etiegwu aha ya bụ Timothy, gwara BBC Igbo na esemokwu a dapụtara maka okwu ego njem N100 dapụtara n'etiti enyi ya Philip na otu onye ọkwọ ọgba tum tum nke kpalitere ọgụ.
O kwuru "Ndị otiegwu a nwere ebe abụọ ha kwesịrị ịga kụọ egwu n'abalị ahụ, n'ihi na ebe abụọ a eteghị aka , ha sị ka ha wụbanye Ọkada ka ọ dịrị ha mfe"
"Mgbe ha ruru ebe ahụ, esemokwu maka ego dapụta"
"Onye ọkada ahụ malitere ịna ego karịrị N100 n'ihe ha kpebiri mana otu onye ogbo m bụ Philip bụ nke esemokwu a nọ n'isi ya nke mere onye ọkwọ ọgba tum tum a ji dọọkaa akwa ya"
Timothy gara n'ihu kwuo:
"Philip ji iwe nwere kụọ onye ọkwọ ọgba tum tum ọkpọ nke mere o jiri daa n'ala ma kubitu nwa mgbe nta"
"Onye Okada nke ọzọ bukwa onye otu egwu aha ya bụ Frank bịara jibido Philip ma kwuo na ọ kọrọ ya ọgwụ dịka ọ kụrụ ya bụ ọkpọ nke mere o jiri daa n'ala etu ahụ ma kubitu nwa mgbe nta"
"Etu ahụ ka o siri kpọkọta ndị ọkwọ ọgba tum tum ndị ọzọ ma gwaa ha na ndị a kọrọ onye otu ha ọgwụ nke mere ha jiri malite tiwe ha ihe"
"Onye otu ha ọzọ aha bụ David abanyela n'ime ebe zubere ịgaa tie egwu dịka ọ maghị ihe na-eme n'ezi ebe ahụ"
Ọ gara n'ihu kwuo "Mgbe ọ nụrụ ihe a na-eme, ọ pụtara igbosa ya bụ ọgụ mana ndị ahụ malitere tiwe ya ihe"
Timothy boro ebubo na onye nwee ebe ahụ David na ndị otu ha ndịa ọzọ bịara iti egwu ghọnarịrị ha atọ mgbe esemokwu a dapụtara nke mere ndị ahụ jiri kaa obi ma kụọ ha ihe nke ukwuu.
O kwuru: "Ndị ahụ malitere kụwa ha ihe ma boo ha ebubo na ha bụ ndị ọgwụ ego"
Otu anya hụrụ ihe a mee na-achọghị ka akpọ aha ya gbara BBC Igbo ama ihe ndị a ma kwuo:
"Ndị uweojii bịara inyere aka dajụọ esemokwu a ugboro ugboro, maa gbalie egbe elu ebe ahụ mana ndị a ekweghị kwụsị ọgụ na mgba na-ada"
O kwukwara "Ndị gara nso n'etiti ndị a na-ese okwu mgbe ahụ kọrọ m etu mgbe etichara nwaamadị ahụ a sị kọrọ onye ọkwọ ọgba tum tum ahụ ọgwụ, ha jiboro ya gwaa ya ka ọ megharịa ọgwụ a sị ọ kọrọ nwoke ahụ"
O sị "Ya bụ nwoke nke ume ya na-achọzị ikupu, rịọrọ ha chọrọ ya mgban'aka nke Bekee na-akpọ 'Ring' ya dapụrụ ka ọ nwee ike megharịa ya bụ ọgwụ"
O kwuru na tupu nke a emee na otu onye agha Naịjrịa anwaala dajụọ ọgụ a dịka ọ kpọọrọ mmadụ atọ ahụ a na-eti ihe ma dubaa ha n'ime ụgbọala ya.
Ọ sị "Ndị igwe mmadụ a ruru ihe dịka 100 gbara ụgbọala ahụ ogige ma malite ịkụkasị akụkịụ ya"
"Ha nwara ịgba ya ọkụ tupu ya bụ onye agha atọhapụ mmadụ atọ ahụ n'ihi ọ chọghị ka agbaa ụgbọala ya ọkụ"
'Ndị ahụ gbaraa David ọkụ dịka ha tịchara ya ihe'
N'ihe onyonyo a na-efegharị nke ndị uweojii gwara BBC Igbo na ha ka na enyocha ịma mmadụ ole so mee ihe a, a hụrụ ebe otu nwoke nọ n'ala dịka e konyere ya Taya ụgbọala ala n'olu.
Ihe onyonyo ahụ gosikwara ebe a wụrụ onye ahụ nke ọtụtụ sị na ọ bụ David ihe dịka mmanụ ụgbọala.
Ihe onyonye ahụ gosikwara ndị igwe mmadụ ahụ ka ha bucha maa osisi ma ihe ndị ọzọ n'aka nke a na-eche eji kụọ mmadụ atọ ahụ ihe.
Ugbua, ndị uweojii ebupụla ozu nwaamadị a a gbara ọkụ n'akụkụ Lekki.
Aha David na-ewu na soshal modia n'okpuru akara - #JusticeforDavid
Ọtụtụ ndị ezinụlọ, enyi, ndị ikwu na ibe David ji aha ya eti mkpu akwa na soshal midia dịka ha na-edepụta #JusticeforDavid nke bụ okwu arịọrọ ka e kpee ikpe ziri ezi n'okwu ọnwụ ya ma nwụchịe ndị niile aka ha nwere ike ịnọ n'okwu a.
Ụfọdụ n'ime ozi nọ na soshal midia kwuru na David a mụọla ụmụ abụọ.
Okwu ịgba ọkụ a dapụtara n'otu izu a bụ izu a gbara Deborah Yakubu ọkụ.
Deborah bụ nwata akwụkwọ 'Shehu Shagari College of Education, Sokoto' nke agbara ọkụ n'ụbọchị Tọọzde, abalị 12 nke ọnwa Mee ,afọ 2022, maka ebubo na ọ kparịrị onye amụma ndị Ụka Alakuba bụ Mohammed.
Ndị uweojii nwụchiri mmadụ abụọ ha na-enyo maka ọnwụ nwada ahụ mana ndị ntorobia nọ na steeti ahụ malitere ụbọchị Satode mewe ngagharịiwe na-ekwu ka a tọhapụ ndị ahụ anwụchịrị.