You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Okada Ban: Etu anyị si taa ahụhụ ịga ọrụ taa - Ndị Legọs
Ụbọchị Monde izu ọbụla bụ ụbọchị ndị ọrụ Bekee na ndị ọrụ dị icheiche ji alaghachi ka e zuchara ike ngwụcha izu.
Mana ndị bi na Legọs takutere ya kọnkịrị dịka ọtụtụ n'ime ha tọrọ n'ụzọ maka mmachi gọọmentị steeti ahụ machiri keke na okada.
Ihe ọzọ pụtara na mmachi a bụ njakịrị ndị mmadụ ji ya ama onwe ha n'elu soshal midia, ọ kachasị ndị ebighi na Legọs.
"Dear Lagosians" "Lagos" "Otrek" "Okada ban" bụ ihe ndị na-ewu na soshal midia n'ihi ya.
Tife gwara ndị mmadụ ka ha hie asaa n'anya maka ndị ntọ ga-achọ ime ka ha a na-enyere ha aka.
Joe Abah na-ekwu na gọọmentị echeghị atụmatụ a eche ọfụma tupu ha amalite ya.
Dr Pampam kwuru na ọ bụ ụgbọala "Danfo" na-ebute kpachi kpachi n'ụzọ mana ọ bụ keke na ọkada ka ha machiri.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe maka ya bụ okwu, ebe ndị ọzọ na-aluso ndị uweojii ọgụ n'ihi mmachi a.
KingMide kọwara ihe anya ya hụrụ mgbe ọgbaghara dapụtara.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị