You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Iwu ọhụrụ: ‘Onye kwụọ ndị ntọrọ ụgwo mgbapụta, ọ gaa nga ruo afọ 15’ - Ụlọomeiwu Naịjirịa
Ụlọomeiwu Naijiria ewepụtala iwu ọhụrụ kwuru na onye ọbụla kwụrụ ndị omekome ụgwọ mgbapụta iji tọhapụ onye a tọọrọ ga-aga nga ruo afọ iri na ise.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-akatọ atụmatụ a ma na-ekwu na nke a ezighi ezi ebe ọ na-emegide ndị na-achọsi ike ịgbapụta ndị ikwu ha.
Iwu a nke a na-eche ka Onyeisiala Muhammdu Buhari binye aka nakwa ka ụlọomeiwu nta tinye ọhụ, ga-ahụ na onye ọbụla e jidere na-atọ mmadụ ga-aga nga mkpụrụ ọka maọbụ nata ikpe ọnwụ.
Kemgbe ihe karịrị afọ iri, Naịjirịa na-agbasi mbọ ike ime ka ndị otu ji egbe na-atọọrọ ndị mmadụ aghara aghara ma na-anapụ ndị ikwu ha ego mgbapụta kwụsị ọrụ ha mana nke adịbeghị ire
Central African Republic (CAR) anabatala iji 'Bitcoin' eme azụmahịa ha
Central African Republic (CAR) anabatala iji ego ọgbara ọhụrụ nke teknụzụ 'Bitcoin' azụ ma na-ere ahịa na mba ha.
CAR bụ mba nke abụọ na-ejizi Bitcoin mere ego ha, mba mbụ bụ El-Salvador dị na South America.
CAR bụ otu na mba n'ụwa kachasị daa ogbonye mana ha nwere ọlaedo 'uranium'.
Tigbuo-zogbuo adaala na mba ahụ nke ya na mba Rọshịa dị na mma ọtụtụ afọ.
Ndị ọmeiwu mba ahụ binyere aka ka e jiri Bitcoin mewe ego ha ugbua.