Komla Dumor Awards 2022: Ihe niile onye ga-emeri nturugo a ga-erite

Ebe foto si, BBC
Ụlọọrụ BBC na-chọ onye ntakụkọ Afrịka na-achake ka kpakpando ugbua n'ọrụ ntaakụkọ maka nturugo "BBC World News Komla Dumor Award" nọ n'agba asaa ya.
A na-achọ ka ndị ntaakụkọ si mba Afrịka tinye akwụkwọ maka irite nturugo, nke a na-eche ga-ekpughe ma wulite ndị ọkaibe ọhụrụ na mba ahụ.
Onye ga-erite nturugo a ga-anọ ọnwa atọ n'isi ụlọọrụ BBC nọ na London ka o wee mụtakwuo etu e si eme ntaakụkọ.
Mgbe a ga-akwụsị itinye akwụkwọ a bụ February 16, 2022 n'elekere iri na otu na ụma (23:59).
E ji nturugo a akwanyere Komla Dumor, onye ntaakụkọ mba Ghana bụ ọkaibe na-arụrụ BBC World News, onye nwụrụ na ntabianya mgbe ọ dị afọ 41, n'afọ 2014.
Nwunye Komla gwara Victoria Rubadiri bụ onye meriri nturugo a n'afọ 2021 na obi dị ya mma maka ihe ọma di ya mere na BBC.
O kwukwara na ezinụlọ ya na-ekele BBC etu ha si jiri nturugo a na-echeta ya.
Onye meriri nturugo Komla nke afọ a ga-enwe ohere ịga mba Afrịka ọbụla gaa mee akụkọ a ga-egosi n'onyonyo BBC ụwa niile.
Udiri ntaakụkọ Komla Dumor mere mgbe ọ dị ndụ gụnyere isetee ihe ndị na-eme n'Afrịka n'ụzọ pụrụiche , ihe ndị metụtara Afrịka nke ukwu nakwa mba ụwa n'ọzọ dị mma.
BBC ga-agba mbọ ịhụ na ha gara n'ihu na-akọ akụkọ Afrịka etu ọ dị ọfụma ka o wee ruo ndị na-ekiri ya n'Afrịka nakwa mba ụwa.
Chọpụta ma itozuru itinye akwụkwọ maka inweta nturugo a.
N'ihi coronavirus, Rubadiri anataghị ọzụzụ ya n'afọ 2020, kama e bugara ya n'afọ 2021.
Mgbe ọ nọ na-anata ọzụzụ na London, ọ gara Kinshasa, isi obodo Democratic Republic of Congo, ikọọ akụkọ maka teknụzụ arụpụtara ọhụrụ iji nweta nchekwa njem.
Ọ bụ onyeisi ukwu BBC niile aha ya bụ Tim Davie nyere Rubadiri nturugo ya.
"Ọ bụ eziokwu na nturugo a na-akwanyere Komla Dumor ugwu nakwa na-egosi na ihe m na-eme masịrị BBC, ahụlam ntolite n'ime onwe m n'ime ọnwa atọ m gara nata ọzụzụ na London" bụ ihe Rubadiri kwuru
Liiliane Landor, bụ onyeisi BBC World Service kwuru na obi dị ya ụtọ na nturugo Komla Dumor eruola agba nke asaa ya.
"Ndị niile riterela nturugo Komla Dumor egosila etu o si ewepụta obi ya kọọ akụkọ gbasara Afrịka site n'ụzọ pụrụiche ha si arụ ọrụ ntaakụkọ ha. Obi dị anyị ụtọ inabata onye ga-emeri nke afọ a iji hụ na ntụzị
Dumor gara n'ihu."
Onye bụ Komla Dumor?
- Dumor nwụrụlanụ bụbụ onye ntakụkọ na-agbaza ozi n'onyonyo akpọrọ 'Focus on Africa.'
- O sobukwa na ndị isi na-agbasa ozi n'onyonyo akpọrọ 'BBC World News' European morning segment.'
- O bidoro rụwara BBC ọrụ n'afọ 2007 ka ọrụchara ọrụ ntakụkọ ruo afọ 10 na Ghana ebe o ritere nturugo dịka ọkaibe na ntaakụkọ nke a na-eme n'afọ ọbụla.
- Site n'afọ 2007 ruo afọ 2009 o bụ onye na-ahazi Network Africa na BBC World News nakwa 'The World Today programme.'
- N'afọ 2009, Komla bụ onye mbụ gbara n'ihe ngosi African business news programme a na-eme na BBC World News. Nke a mere ka ọ na-eme njem na-agakwụrụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Afịrịka ma na-akọ akụkọ gbasara azụmahia na mba Afịrịka
- N'afọ 2013, Dumor gbara n'akwụkwọ ndị 100 kacha nwee ọnụ n'Afịrịka nke ụlọọrụ mgbasaozi "New African Magazine" bipụtara.











