Waihiga Mwaura si Kenya bu onye ritere BBC World News Komla Dumor award
Otu onye ntaakụkọ Kenya na-arụ n'ụlọọrụ TV ha eritela elele nturuugo nke BBC na-enye n'aha onye ntaakụkọ ya nwụrụ anwụ akpọrọ BBC World News Komla Dumor Award.
Waihiga Mwaura, bu onye ritere nturuugo a, na-agụ akụkọ mgbede na ụlọọrụ ntaakukọ Citizen TV dị na Nairobi.
N'ime ihe nrite a onwetere, ọ ga-aga soro ndị ọrụ BBC rụọ ọrụ na London, ebe ọ ga-anọ ọnwa atọ tupu ọ laghachịte n'ọrụ ya.
BBC wepụtara ihe nrite a iji kwanyere Komla Dumor, bụ onye na-arụbu ọrụ dịka onye na-agụ akụkọ na BBC World News tupu ọ nwụọ n'afọ 2014. Ọ dị afọ 41 mgbe ọnwụrụ.

Maazi Mwaura bụ onye nke anọ turu ugo a, ka Nancy Kacungira, onye Uganda, bu ụzọ rite ya n'afọ 2015. Ndị ọzọ bụ Didi Akinyelure na Amina Yuguda.
Onye bu ezigbote onye ntaakụkọ ama ama ọfụma na-ekwu maka ndọrọndọrọ n'egwuregwu.
Ọ sị "Ihe Komla Dumor pụtara m dịka onye ntaakụko na mmadụ m bụ karirị."
"Yabụrụ na m nwereike ime ihe o mere ruo pacenti iri maọbu pacenti iri abụọ, ọ ga-adị m ka m a rụọla ọrụ ntaakụkọ m."
"Dika onye Afrịka m bụ, enwere m mpako na m nwere ụdịrị ohere ịkọrọ ụmụ ụwa akụkọ banyere Afrịka."
Ṅdị nyochara ihe ndị mmadụ tinyere maka nturuugo kwuru na o juru ha anya etu nwaamadị a si akọ akụkọ.
Ndị họpụtara ya sị na mmasị ya inye Afrịka onu ọma nakwa etu o si agbasa ozi nke nchọpụta na nyocha mere ka o merie ndị ọzọ tinyere akwukwọ maka nturuugo a.











