Salle: Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka nwada a Salle si n'ibugharịa ahịa bụrụ otiegwu na-ewu ewu

Ebe foto si, Salle/Instagram
Izu ole na ole gara aga, o nweghị onye ma ya mabụ onye nụtụrala aha ya karịa ndị ezinaụlọ ya na ndị agbata obi ha.
Mana n'otu ntabịanya, nwada Salle akụkọ kwuru na ọ bụ ebe ọ na-ebugharị ahịa n'Owere, Imo steeti ka a nụrụ olu egwu ya, ya aghọọla akara ọkụ.
Ndị obiọma mịtara egwu ya ma tinye ya na ịntanet dịka ha zigara ya ndị na-emepụta egwu a na-ahụ aha ha na Naijiria.
Ugbua, naanị otu ịzụ ụka akụkọ ya jiri gbaa, o nwetala ihe karịrị ndị nsonso karịrị narị puku abụọ.
Mana ụfọdụ na-eche na akụkọ ya bụ akụkọ Mama Ngozi na ndị yard ya nke e ji chọọ ime ka ụwa mata maka nwada ahụ olu ya na-ada ka ogene.
Akụkọ ka na-abịa






