Food blockade: Ndị ugwu akwụsịla abụbụ ha gbara maka ibubata nri dịka gọọmentị kwetara ịkwụ ha ụgwọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu jikọrọ ndị na-ere ihe nri nakwa anụ na mpaghara Ugwu Naịjirịa akwụsịla abụbụ ọrụ (food blockade) ha gbara nke ha ji kwụsị ibubata ihe oriri nakwa anụ ehi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa.

Ha mere nke a dịka ha na gọọmentị etiti nwechara ọgbakọ n'Abuja n'ụbọchị Wenezde, ebe Gọvanọ Kogi Steeti bụ Yahaya Bello nọchịrị anya gọọmentị etiti.

Femi Fani-Kayode, onye bụbu Mịnịsta njem ụgbọelu na Naịjirịa, nọkwa n'ọgbakọ ahụ.

Muhammad Tahir bụ onyeisi otu a kpọrọ 'Amalgamated Union of Foodstuff and Cattle Dealers of Nigeria' (AUFCDN) kwuru na ha kwụsịrị abụbụọrụ ha gbara n'ihi na gọọmentị ekwetala ịkwụ ha ụgwọ iti aka n'obi ma kwe nkwa ichekwa ndị otu ha.

Tahir kwuru sị: "Obi dị anyị bụ ndị otu ahịa nri mma, n'ihi na ihe niile anyị chọrọ gọọmentị emeela ya."

"Gọvamọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello arịọla anyị n'aha gọọmentị etiti, ya mere anyị ji kwe ịkwụsị abụbụ ọrụ a taa (bụ Wenezde Maachị 3)."

"Gọọmentị kwetara ịkwụ anyị ụgwọ iti aka n'obi, ma wepụkwa ọtụtụ ụtụisi ha na-ana anyị, nke a ga-eme ka anyị na-azụ ahịa anyị nke ọma."

Etu nkwụsị mbubata nri si metụta ala Igbo

Dịka azụmahịa ndị ugwu na Naịjirịa manyere nkwụsị orire nri si n'ala ha maka esemokwu dị n'etiti ndị ọchiehi na ndị ọrụ ugbo, ndị mmadụ ebidola hụwa ụkọ ma mbuli ọnụahịa ọtụtụ nri di icheiche na mpaghara ala Igbo.

Soro anyị na njem ahịa dị icheiche na mpaghara ala Igb ka anyị gosi gị etu ọnụ ahịa ha sị dị

N'ahịa dị n'Ọka (Awka, Anambra steeti)

N'Ọka dị n'Anambra steeti, ndị mmadụ na-azụ ahịa sị na ọnụ nri ndị esi ugwu Naijirịa arịala elu.

Onye ntaakụkọ ABS gara n'ahịa ahụ ịme nchọpụta n'ahịa Eke Awka bụ onye hụtara nke a.

O kwuru na ma ndị na-azụ ahịa ma ndị na-ere ahịa na-atamụ maka ọnụ ahịa ahụ.

Lee ihe ọ chọpụtara n'uju:

Anụ adịghịzi adị, nke ọnụ ahịa ndị a hụrụ gbaliri oke elu nke mere ka ndị mmadụ hapụ ịzụ azụ ya.

Nkata tomato bubụ N3,000 bụzị N25,000

Nkata ose bụbu N4,000 bụzị N15,000

Ji bụbụ 600 bụzị 800 wdg.

Mangoro bubu 50 bụzị 100 ugbua.

Cheta na ndị azụmahịa ugwu Naịjirịa manyere nkwụsị orire nri si n'ala ha maka esemokwu dị n'etiti ndị ọchiehi na ndị ọrụ ugbo.

Na Legọs steeti

Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Gbenga Omotosho agwaala ndị steeti ahụ ha atụla egwu maka ụkọ nri.

O kwuru na n'agbanyeghị na gwongoworo bu nrị si ugwu abịa tọrọ n'ụzọ na nrị ga-adịrị ndị Legọs steeti niil.

O kwukwara na 'gọọmentị ma anya ihe na-aga ma kwuo na ha agaghị ekwe ya ghọrọ ọgbaghara.

Akụkọ si styeei ndị ọzọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ka na-abịa...