You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Burna Boy agbaala n'ihe emume Trevor Noah
Burna Boy agbaala n'ihe emume Trevor Noah bụ nwa afọ Saut-Afrika bụ ọkpaọchị a ma ama na mba Amerịka.
Nke mere ụmụ Naijiria jiri kpụrụ ya na Trevor n'ọnụ.
Burna Boy, onye gụrụ egwu ya a kpọrọ "ye" nakwa "Anybody" n'ihe emume Noah gosiri na ọ bụ ezigbo nwa Naijirịa ka ọ wuchiri.
Ka nwa amaadị a ritere nzere "BET international act afọ 2019' na Trevour kelechara, ihe pụrụ ya n'ọnụ bụ "How una dey now?"
Ọ kọọkwara Noah etu ya siri zute ya mbụ na Saut Afrika n'afọ 2014.
"Anyị na-achọ ịbanye, ebe Trevour na-achọ ịpụta. Ndị mmadụ na-eti "Trevor! Trevor"
Nwaanyị m na ya so gaa jụrụ biko a chọrọ m ị ga-kelee Trevour ma agbọja ya, 'nọọ ebe ịnọ."
Akụkọ ya tọrọ Trevor nnukwu ọchị dịka o kwuru na ọ bụrụ ụfọdụ mmadụ, ha ga-eji maka ihe ahụ mere bido kpọwa ya asị.
Trevor Noah: Kedụ ihe mere egwu Naijiria nakwa egwu si Afrịka ha ji achake n'ụwa niile ugbua?
Burna Boy: Ihe niile na-alaghachi ebe o si. Ọ bụ maka na egwu si n'Afrika bịa, egwu na-alaghachịkwa n'afrịka ebe o si.
"Mgbe ihe niile mebichara, onye ọbụla alawa.
Trevor Noah: Ị kpọrọ egwu gị ' Afro fusion' gịnị bụ 'Afrofusion.'
Burna Boy: "Afrobeat dịka 'pizza,ntọala ya bụ 'flour', i nwere ike ifenye ya 'hip-hop' maọbụ 'pepperoni' maọbụ 'dancehall' bụzị ihe ndị a na-etinye ya were nweta ụdị egwu ị chọrọ."