Anthony Joshua ga-ezute Jarrel Miller n'asọmpi

Akụkọ dị mkpa:

Anthony Joshua na Jarrel Miller ga-asọ mpi

Jarrel Miller, Anthony Joshua

Ebe foto si, Getty Images

N'egwuregwu,

Nwafọ Naijiria na-agba mgba n'aha mba Briten bụ Anthony Joshua ga-alụ ọgụ ya mbụ na mba Amerika oge ya na Jarrel Miller ga-ezute na Madison Square Garden maka ịzọ ikike ya dịka ọkaibe na mgba n'ụwa niile, n'abalị mbụ.

Agbakoba akatọọla iwu e nyere ka anwụchie Onnoghen

Walter Onnoghen

Ebe foto si, @Crevo360_Ng

Nkọwa foto, Justice Walter Onnoghen

Onye bụbu onyeisi otu jịkọtara ndị ọkaiwu na Naịjirịa (NBA) bụ Olisa Agbakoba akatọọla iwu ụlọikpe pụrụ iche a kpọrọ 'Code of Conduct Tribunal (CCT)' nyere ka a nwụchie ọkaikpe Onnoghen.

N'ụbọchị Wenezde, onyeisioche tribunal bụ Danladi Umar nyere iwu ka anwụchikọ Onnoghen n'ihi na ọ bịaghị n'ụlọikpe.

Mana n''akwụkwọ ozi o wepụtara, Agbakoba kwuru na "CCT kwesịrị ichere mpụtara ikpe gbasara okwu ahụ nke ka nọ NJC, ụlọikpe mgbegharị nakwa ụlọikpe ukwu nke etiti"

Ọ kọwara na agwa megidere usoro ịgbaso ihe dịka o siri kwesi.

Umahi,Ohaneze asaala Nnamdi Kanu

Dave Umahi na Nnia Nwodo

Ebe foto si, BBC/Nnia Nwodo

Aka na-achị Ebonyi steeti ma bụrụkwa onyeisi ọgbakọ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ bụ Dave Umahi nakwa onye ndu otu Ohaneze bụ Nnia Nwodo agọọla ebubo Nnamdi Kanu boro ndị gọvanọ Igbo na ha bụ ndị kpara mkpata ka ha gbuo ya.

Ha kwuru na ebubo ahụ bụ asị kpụ ọkụ na ọnụ n'ihi na ọ bụ aghara Nnamdi Kanu kpara mere ka ndị agha Naijiria wakpo ụlọ ya n'oge Egwu Eke.

Mmadụ 15 nwụrụ n'achụmta vootu APC na Pọtakọt

Ụlọọrụ dị na Rivas steeti gwara BBC na ụmụnwaanyị iri na abụọ na ụmụnwoke atọ

Ebe foto si, Tonye P Cole

Ụlọọgwụ 'University of Port Harcourt Teaching Hospital", (UPTH) ekwuola na ọ bụ mmadụ 15 nwụrụ n'ọgbọegwuregwu Adokiye Amiesimaka, ka otu 'All Progressive Congress" (APC) mere achụmnta nke ọkwa onyeisiala n'abali iri na abụọ nke ọnwa Febrụwarị, 2019.

Ndị nwụrụ gụnyere ụmụnwaanyị iri na abụọ na ụmụnwoke atọ.

Zimbabwe chọrọ iwepụ iwu megitere mgbasaozi

Ndị imeobi gọọmenti mba Zimbabwe ekpebiela iwepu iwu megidere ndị ọrụ mgbasaozi nke e ji nwụchie ndị ntaakụkọ ma mechikwa ọtụtụ ụlọọrụ ntaakụkọ oge ọchịchị Robert Mugabe.

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile