You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
#NigeriaAt58: Ihe ndị mmadụ mere iji cheta ụbọchị a
Ọtụtụ mmadụ ka na-ekwuputa olileanya ha nwere na ebe Naịjịrịa nọ dịka ọ gbara afọ iri ise na asatọ.
@BashirAhmaad bụ onye na-eme ihe niile gbasara onyeisiala n'elu soshal midia gosiri ihe nkiri a ebe ndị agha kwụ n'aghịrị zọọ ije.
@obyzeks kwuputere olileanya ọ ka nwere n'Obodo Naịjirịa ma yiri uwe gosiri na Obodo ya na-amasị ya.
@bukolasaraki kwuru kelere ụmụ Naịjịrịa, ma jiri ohere a na-ayọ ka onye ọ bụla bie n'udo.
@CIPHER_RR kwuru na ihe nkiri a ga-eme gị ị mara na ị hụrụ Naịjirịa n'anya nke ukwuu.
@BennyCapricorn ji foto a egosi ihe mberede dị iche iche na-eme n'akụkụ Naijiria dika a na-eme emume ncheta a.
@KADAssembly ji ohere a ekele ndị isi mbụ chiburu anyị.
Onyeisala Muhammadu Buhari kwuru na nagbanyeghị ihe isi ike Naịjirịa na-agabiga, ọ ka na-aga n'ihu.
O kwuru nke a mgbe gụpụtara ozi ụbọchị ncheta nwereonwe Naijịrịa.
Buhari kwuru na ọchịchị ya meriela mpụ na aghụghọ nakwa ndị agha Boko Haram.
Ihe ise dị mkpa o kwuru:
- Buhari kwuru na ọchichị emeela akụ na uba si na ọrụ ụgbọ na-apụta
- O kwuru na o onyela ndị ntorobia ikike ị bụ ihe ha chọrọ ị bụ ma zọkwa ọchịchị
- O kwukwara na ọchịchị ya mere ka ndị ofesi kwanyere Naịjịrịa ugwu nke ukwuu.
- Buhari kwuru na ya arụọla ụzọ,akwammiri, ụlọakwụkwọ,ma nye ndị agha Naịjịrịa enyemaka ga-abara ha na ndị be ha uru.
- O kwuru na Naịjịrịa bụ ebe ndị oji ego achụ ego na-amasị maka etu akụ na ụba sị dịmma
Gịnị ka October 1 pụtara:
Ọ bụ taa ka Naịjirịa nwetere nwereonwe ha n'aka ndị ọchịchị nke Mba Britain.
Ọ bụ Abubakar Tafawa Balewa onye nwụgoronụ bidoro ọchịchị nwereonwe Naịjirịa.
Mana ka afọ atọ gachara, Naịjirịa bụrụzịa rịpọblik ebe Nnamdị Azikiwe bụ onyeisiala mbụ chiri na ya bụ Rịpoblik.
N'afọ 2010, Naịjirịa mere emume ncheta nwereonwe ha nke afọ iri na ise nke a na-akpọ "Golden jubliee."
Taa Naịjirịa dị afọ iri ise na asatọ.
Taa ka eweturu ọkọlọtọ nke ndị Britain bụ "British Union Jack" na Naịjirịa ma welite ọkọlọtọ "green white green" nke Naịjrịa.
Ọ bụkwa taa ka e wepụtara iwu ala nke ndị Naịjirịa ga-eji na-achị onwe ha.
Ndị ọchịchị Britain wepụtara ngalaba atọ dịka nke Ọwụwa anyanwụ, ugwu Hausa, nakwa Ọdịda anyanwụ.
Kamgbe ahụ, ụbọchị October 1 abụrụla emume ndị Naịjirịa na-echeta ma tule ihe niile gbasara ọchịchị,akụ na ụba, mmekọrịta na nwulite ha dịka Obodo.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu Soshal:
@Muhd_Taofeek ji ohere a wee bụọ abụ ala nke Naịjiria ma nye onwe ya olileanya na iheọma ka dị n'ihu na Naịjịrịa.
@aazailani_jr na-enwekwa aṅụrị n'elu twitter.
@TheCeoNigeria na-enyekwa onwe ya nnukwu olileanya na Naịjirịa ga-adịmma ọzọ.
@KADAssembly kwuru na ọ gaghị echezọ ahụhụ ndị chibụrụ Naịjirịa na mbụ tara.
Mana ndị nke a nwere echiche ọzọ:
@MartinsChicruz sị na ọ bụ ncheta nwereonwe nke ahụhụ na ihe ọjọ dị iche iche juru kamgbe afọ iri na ise gachara.
@legendarytunde ji taa gụputa ihe niile na adịghị mma na Naịjiria.
Akụkọ ga-amasị gị: