Buhari aburula onyeisi Ecowas

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadụ Buhari aburula onyeisioche ọhụrụ otu jịkọrọ mba nọ na'ọdịda anyanwụ Afrịka a kpọrọ Ecowas n'aha Ịchafụ.

Nke a mere na ngwụcha ọgbakọ Ecowas e mere na Lome, isiobodo mba Togo.

Otu n'ime ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Bashir Ahmad bụ onye kwupụtara nke a n'igwe okwu Twitter ya.

Cheta na ndị isi mba dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka gbakọrọ na Lome ịkpa maka udo, nchekwa na ịlụ ọgụ megide iyi ndụ egwụ.