#FreeOwerri112: Ụmụ Naijiria na-eti mkpụ ka a tọhapụ ụmụnwaanyị Igbo

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Kemgbe abalị asaa gara aga, ụmụnwaanyị ruru puku abụọ mere ngagharịiwe n'Owere ịji jụọ ebe Nnamdị Kanụ nọ, ihe karịrị otu narị na iri abụọ n'ime ha ka nọ na mkpọrọ.

Ndị uweojii na-ebo ha ebubo ịgbakọ n'aha otu a machiri amachị bụ Ipob nakwa igbosa udo obodo.

Mana ụmụ Naijiria agbakaala n'iwe sị na ọ bụ mmegide ijide ndị na-eme ngagharịiwe n'udo, ebe ndị ogbu ọchụ na-akpagharị na-enweghị ihe e mere ha.

N'okwu ya, @ChidiOdinkalu, onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye a ma ama kwuru na taa bụ Fraide nke abụọ ụmụnwaanyị ndị a ga-anọ na nga maka ịme ngagharịiwe n'obodo na-agba ndị ogbu ọchụ nkịtị.

Odinkalu gara n'ihu kwuo na ndị uweojii nwụchiri ụmụnwaanyị ndị a maka ebubo ịbụ ndị oyiegwu na ndị na akpa nkata megide gọọmenti n'ihi na ha mere ngagharịiwe na-eyighị akwa elu.

@JulietKego kwuru na mkpọchi a kpọchiri ụmụnwaanyị n'Owere bụ ndị ezinaụlọ ha, ndị enyi nakwa obodo ha ka a kpọchiri.

@fribone kwuru na enweghị ihe ụmụnwaanyị a mere nke megidere iwu ga-eme ka a nwụchie ma kpọchie ha na mkpọrọ. N'agbanyeghị nke a, onwebeghị ihe onyeisiala maọbụ Mịnịstri na-ahụ maka okwu ụmụnwaanyị kwurula maka ya.

Ụfọdụ dịka otu @WomenAfrica35 na @SERAPNigeria na-ajụ ajụjụ ụdịrị gọọmenti nwere ike ijichị ụmụnwaanyị ikwu uche ha.

Ndigbo nwere agba mechiri ọnụ

Ụfọdụ na-egosi iwe na enweghị Ndigbo ọnụ na-erụ n'okwu dịka Ohaneze na ndị ọkaiwu Igbo nwere agba na-etinye ọnụ n'ọkwụ #FreeOwerri112.