Gịnị mere e ji ezi ọha ndị a na-enyocha maka mpụ na Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images
Ka BBC jụrụ ihe kpatara e ji agba ndị a na-enyo enyo maka mpụ n'ihu ọha na Naịjirịa, otu ọkaiwu, Chijioke Ikeh, kwuru na enweghị iwu machiri ndị uweojii ịhapụ ka ndị ntaakụkọ gbaa ndị ahụ ajụjụọnụ.
Ọtụtụ oge ka ndị uweojii na-anwụchi ndị ha na-enyocha maka mpụ dịka izu ohi, igbu mmadụ, ịtọ mmadụ nakwa ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche.
Mana ebe e nwere ike isi taa ha ụta ma ọ bụrụ na ị tunyere ha na mba ndị ọzọ, bụ ịkpọpụta ndị a na-enyocha maka mpụ ndị a n'ihu ọha, ka ọha 'kpee ha ikpe', site n'ịhapụ ndị ntaakụkọ ka a gbaa ha ajụjụ ọnụ.
Ọkaiwu Chijioke Ikeh gwara BBC Igbo na ebe iwu nwere ike imegide ndị uweojii nke ndị mba ọzọ, iwu emegideghị ndị uweojii Naịjirịa maọbụ ndị ntaakụkọ ịgba ndị a na-enyo maka mpụ, ajụjụọnụ.
O kwukwara na ọ bụrụ na ndị ntaakụkọ agbaghị ha ajụjụọnụ, na agaghị ama ihe na-eme n'obodo.
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:
N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Enugwu steeti bụ Ebere Amarizu kwenyere na o nweghi ihe o mere ma ndị uweojii na-ahapụ ka ọha hụ ndị a na-enyocha.
Amarizu kwuru na ọ na-egosi na ndị uweojii na-arụ ọrụ ha, ma kwuo na ọ ga-eme ka ndị mmadụ mara na e nwere ike ịkpọpụta ha ma gbaa ha n'anwụ ma ha mee ụdịrị ihe ahụ, nke ga-eme ka ha mụrụ akọ.
Gere ihe o kwuru n'uju ebe a:
N'aka ọzọ, Benjamin Amaechi bụ onye na-akwado ikike dịirị onye, gwara BBC Igbo sị "ọtụtụ mgbe ndị uweojii na-akpụpụta ndị na-enweghị ihe ha mere."
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:

Akụkọ ndị ga-amasị gị:













