Oke mmanya: Etu FRSC ji chọọ iji 'breathalyzer' kwụsị mberede okporoụzọ

Adeyemi Obagbemiro bụ osote onyeisi n'ụlọọrụ na-ahazi nchekwa njem okporoụzọ a kpọrọ FRSC n'aha ịchafụ, gwara BBC na iwebata 'breathalyzer' abụghị isi okwu, maka na aka ga-ahụ na ọ rụrụ ọrụ o kwesịrị ịrụ ezughị ezu.

Obagbemiro kwuru na ndị na-arụ ọrụ FRSC dị ihe ruru naanị nchịkọta puku 30 agaghị agazu ndị Naịjirịa niile ruru mmadụ nde 180, nke bụ na 'breathalyzer' ndị agaghị arụnwu ụdịrị ọrụ a chọrọ ka ha rụọ.

O kwukwara na ha nwere ndị nkịtị ha na-ejibu arụ ọrụ, nakwa nke elektrọnik mkpụrụ ole na ole ha na-eji tupu e bido ikwu okwu ịzụta ndị ọhụrụ.

Gịnị bụ 'breathalyzer'?

'Breathalyzer' bụ ihe a na-eji enyocha ikuku ọnụ mmadụ ma a chọrọ inyocha ma ọ ṅụrụ mmanya na-aba n'anya, ma marakwa etu mmanya ahụ ha n'ime ọbara ya.

Ndị uweojii na ndị ọrụ okporoụzọ nke bekee kpọrọ 'traffic police' maọbụ ụdịrị ndị FRSC na-eji ya enyocha onye ọbụla ha na-eche na-anya ụgbọala ka onye mmanya na-egbu.

Ihe FRSC ga-eme onye e jidere maka ṅụ mmanya na-akwọ ụgbọala

Obagbemiro kwuru na ọ bụrụ na 'breathalyzer' enyochapụta na ị ṅụrụ mmanya na-akwọ ụgbọala, ha ga-eme ihe ndị a:

  • Kwụsị gị ime njem ahụ n'oge ahụ.
  • Kpachie ụgbọala onye ṅụrụ mmanya ruo oge mmanya pụchara ya n'anya.
  • E nwere ike ịda onye ahụ nha nke Bekee kpọro 'fine'
  • Ọ bụrụ na onye ṅụrụ mmanya tinye ndị mmadụ n'ajọ ọnọdụ maka ụgbọala ọ na-anya, e jide ya, e nwere ike ịgba ya akwụkwọ n'ụlọikpe.

Uru dị na 'breathalyzer'

1. Nke elektọnik, ihe ị tinyere bụ ihe ga-apụta.

Obagbemiro kwuru na a bịa na nke elektrọnik, onye ṅụrụ oke mmanya kuba ikuku si n'akpaume ya n'ime 'breathalyzer', ihe ọ ga-ewepụta bụ ogo mmanya na-aba n'anya dị n'ahụ gị rugooro kpọmkwem.

2. Ọ ga-eme ka ndị mmadụ kpachara anya

Obagbemiro kwuru na ndị ọkwọ ụgbọala mata na ha nwere ike ịbanye nsogbu ma 'breathalyzer' gbaa ha ama, ha ga-eme ihe abụọ;

Otu bụ ịhapụ ịṅụ mmanya tupu ha abanye ịkwọ ụgbọala, abụọ bụ ịnụ naanị ọbere mmanya ọpekata mpe otu awa tupu ha abanye ịkwọ ụgbọala.

Ụzọ abụọ a ga-eme ka ihe mberede okporoụzọ belata.

Ọghọm dị na 'breathalyzer'

  • Onye nwere ọrịa na-efe efe dịka 'tuberculosis' fụnye ikuku tupu onye ọzọ a fụọ, o nwere ike ife ya.
  • Ihe e ji ahụ mpụtara 'breathalyzer' nke elektrọnik nke Bekee kpọrọ 'sensor', nwere ike na-eme etu masịrị ya, ọkachasị ma ọ nọfee afọ ise.
  • Ihe dị n'ikuku mbara eluigwe dịka ọkụ anwụrụ (cigarette smoke), 'carbon monoxide' nakwa ihe ndị ọzọ nwere ike imebi mpụtara(result) ọ ga-ewepụta.
  • A na-eji akwụkwọ litmus eme nchọpụta n'ikuku a fụnyere na 'breathalyzer' nke aka nkịtị, nke nwere ike ire isi abụọ.
  • Ọ na-agalaọnụ. Ole ka a ga-azụ, ole ka a ga-ahapụ?

Akụkọ ndị ga-amasị gị: