You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anyị ekwenyeghị na mpụtara ntuliaka Ekiti, mmerụaka juru ya - PDP
Ntuliaka Ekiti:
Otu PDP etinyela ọnụ na ntuliaka e mere n'Ekiti.
Ha kwuru sị na agaghị akwọrinwu ha, ma kwuo na ha ekwenyeghị na rịzọọtụ ndị INEC wepụtara na ntuliaka a maka na ọ bụghị nke ọma ya dịka ha sị na ọ bụ APC, ndị ọrụ nchekwa na ndị INEC gbakọrọ aka ọnụ wepụta ya.
N'akwụkwọ ozi Kola Ologbondiyan bụ odeakwụkwọ ọha nke Bekee kpọrọ 'National Publicity Secretary' nke PDP niile depụtara, o kwuru na PDP jụrụ rịzọọtụ a maka na mmerụaka dị ya.
O kwukwara na ịkpọ Kayode Fayemi onye meriri ntuliaka a bụ "izu mmadụ ohi n'anya ọcha, nakwa ime ihe na-abụghị uche ndị mmadụ nakwa iwakpo ọchịchị onye-kwuo-uche-ya nke anyị.
Ologbondiyan kwuru na rịzọọtụ ndị si n'ebe e mere ntuliaka na gburgburu steeti ahụ gosiri na "onye PDP bụ Kolapo Olusola-Eleka meriri etu tụrụ n'anya karịa Fayemi, mana Inec gbanwere ya ebe a na-agbakọ rịzọọtụ."
EFCC na Fayose
N'aka ọzọ, ọ dị ka Ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na mmerụaka ego na Naịjirịa akpọrọ EFCC a na-eche onye na-achị Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose aka mgba.
Maka mmeri Kayode Fayemi bụ onye ga-anọchi Fayose meriri na ntuliaka, EFCC dere na Twitter sị "Mmemme ebiela, akwa mgbochi ekewaala. Akwụkwọ ikpe mmerụaka gbasara ụlọọrụ ebe a na-azụ anụmanụ n'Ekiti ebe e mefuru naịra nde 1.3 ga-emepe. Anyị ga-ahụ n'oge na-adịghị anya."
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: EFCC gwara Fayose: Anyị ga-ahụ n'oge na-adịghị anya
Akụkọ si mba ọzọ
Ndị uweojii na ndị na-eme ngagharị iwe akụkọtala mpi maka otu nwoke onye uweojii gbagburu maka na o che na o bu egbe.
Ndị uweojii atọ merụrụ ahụ, ebe a nwụchiri ndị ngagharị iwe anọ.
N'egwuregwu
Frans ebuliela Iko Mbaụwa nke 2018 ka ha ji ọkpụ anọ asatara abụọ merie Kroeshia taa.
Mmeri Frans mere ya ugboro abụọ ha ga-ebuli Iko a. Cheta na ha buliri ya bụ iko n'afọ 1998.
Ọ bụrụ na Kroeshia meriri, ọ gaara abụ mbụ ha na-erute agba a ma bulie ya bụ Iko
Gụọ etu Frans si merie n'uju ebe: World Cup 2018: France ebuliela Iko Mbaụwa 2018
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri nke taa
Raymond Aliga bụ nwaafọ Igbo kwenyere n'akụ-ruo-ụlọ. Ọ sị na ọ bụ ya mere o ji wulite nnukwu ụlọ ebe a na-arụpụta ihe n'ala Igbo.