You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
EFCC gwara Fayose: Anyị ga-ahụ n'oge na-adịghị anya
Ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na mmerụaka ego na Naịjirịa akpọrọ EFCC edeputala nke na-akpa ha ebe aka na-achị Ekiti steeti na-apụ apụ nọ.
Ha depụtara n' akara Twitter ha sị "Mmemme ebiela, akwa mgbochi ekewaala. Akwụkwọ ikpe mmerụaka gbasara ụlọọrụ ebe a na-azụ anụmanụ n'Ekiti ebe e mefuru naịra nde 1.3 ga-emepe.
Anyị ga-ahụ n'oge na-adịghị anya."
Lee ihe ndị mmadụ sara ha na Twitter
@odineisipatrick kwuru na EFCC egosighị na ha ma ọrụ ha site n'ihe ha depụtara na Twitter.
@KadariaAhmed kwuru na EFCC ekwesighị ịdepụta ya etu a ma ọ bụrụ na Fayose mere mpụ.
@El-bethel316 kwuru na ọ bụ ihe dị mma ma ọ bụrụ na a ga-eme ya ndị ọzọ nwekwara mgbochi onye nọ n'ọkwa ọchịchị.
Anyi ga-ewetara unu akụkọ a dịka o si aga .