You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abali a: Shehu Sani chọrọ ka e nye ndị Ogoni 9 nturuugo
Akụkọ kachasị mere taa;
Shehu Sani chọrọ ka ndị Ogoni 9 nweta nturuugo
Sinetọ Shehu Sani ekwuola sị na gọọmentị etiti kwesịrị ịrịọ ezinaụlọ Ken Saro Wiwa na ndị ogoni ndị ọzọ ahụ nwụrụ anwụ mgbaghara ma nyekwa ha nturuugo.
O kwuru sị ka e nyekwa Shehu Musa Yaradua, Beko Ransome-Kuti nakwa Chima Ubani nturugo.
Etigbuolanwoke gburu nwaanyị
E tigbuola otu nwoke n'obodo Kisumu dị na mba Kenya ka a hụrụ ozu nwaanyị ọ fọnyere n'ime akpati.
Kim Jong-Un a ga-aga Rọshịa?
Vladimir Putin bụ onyeisi mba Rọshịa akpọọla Kim Jung-un nke Nọt Koria oku ka ọ bịa njem nleta na Rọshịa n'ọnwa nke asatọ nke afọ a.
Putin sị na ya nabatara ogbakọ Kim na Trump mere n'ime ụbọchị ole na ole gara aga.
N'egwuruegwu,
Asọmpi Iko Mbaụwa nke 2018 ebirila ọkụ taa, dịka mba Rọshịa bu ụzọ nye goolu mbụ n'asọmpi ahụ.
Ọ bụ Yuri Gazinskiy nke Rọshịa ji isi buba boolu a na nkeji iri na otu ebidochara ya bụ egwuruegwu.
Rọshịa mechara gwọọ Sawudi Arebia ka ji mmanụ. Ha gbatara Roshịa 5 - Sawudi 0.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: