Sinatọ Nwaoboshi agaala mkpọrọ Ikoyi

EFCC

Ebe foto si, EFCC

Nkọwa foto, EFCC na-enyo Pete Nwaoboshi bụ onye na-eso gọvanọ chịbụrụ Delta Steeti bụ James Ibori kemgbe afọ abụọ

Ngalaba na-ahụ maka mpu na aghụghọ akpọrọ Economic and Financial Crimes Commision na bekee akpeela ome iwu Peter Nwaoboshi n'ụlọ ikpe dị na lagos steeti taa.

Ha na-ebo Nwaoboshi ebubo gbasara mpu ego.

Onye okaiwu ya bụ Valerie Azinge rịọ ụlọikpe a ka ha ji ego gbapụta ya.

Mana okaikpe Mohammed Idris kwuru ya ga-eme mkpebi ikpe a n'ụbọchị iri abụọ na asaa, n'ime ọnwa a.

Peter Nwaoboshi

Ebe foto si, Peter Nwaoboshi/Facebook

Nkọwa foto, Peter Nwaoboshi na-agọ ebubo ndị a niile

O kwukwara na ha ga-eji Nwaoboshi na mkporo Ikoyi n'ime Lagos steeti ruo oge ahụ.

Nwaoboshi na otu ụlọọrụ akpọrọ Golden Touch Construction Project Limited na Suiming Electricals Limited ka ha na-ebo ebubo a.

EFCC kwuru na Nwaoboshi na ndị ụlọọrụ a ji nde naira 805 zuru otu ụlọ akpọrọ ụlọ-Guinea n'Apapa n'ime Lagos.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ