You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mmadụ 10 anwụọla n'ezinaụlọ onyeomeiwu
Mmadụ iri gunyere ụmụ atọ, nwụnarịrị onye ụlọomeiwu Zamfara bụ Saidu Yarkufoji n'ihe mberede okporoụzọ.
NAN kwuru na ihe mberede ahụ mere na okpororụzọ Sokoto-Gusau road ụbọchị ụka tara isi ụmụụmụ ya anọ, ụmụnne nwaanyị ise na onyeọkwọ ụgbọala ya.
Ndị mmadụ na-egosi obi mwute ma na-ekpere ndị nwụrụ anwụ ekpere.
Fatima Mohammed Abbas, "Ka Allah gbaghara ha nabata mkpụrụobi ha"
Nasiru Ahmed, bụ ọnụ na-ekwurụ ngalaba na-ahụ maka njem nke a kpọrọ FRSC gwara ụlọakụkọ News Agency of Nigeria na ihe mberede ahụ ụgbọala Volkswagen kụkọtara na gwongworo kụkọrọ isi.
"N'ime mmadụ iri nwụrụnụ n'ụgbọala bụ mmadụ iri na abụọ, itoolu bụ ụmụnwaanyị."
Ahmed, kwukwara na mmadụ abụọ ndị merụrụ na-anata nleta n'ụlọọgwụ,Yariman Bakura Special Hospital dị na Gusau.
Ọ rịrịọ ndị na-akwọ ụgbọala ka ha gbara njem abalị na ịgba oke ọsọ ọsọ.
Akụkọ ga-amasị gị: