You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọrụ MMM ebiela site n'ọnwụ Mavrodi bụ onyeisi
Gịnị ka ndị tinyere ego ha n'ime ebe a na-atụkọ ego iji nweta mmụbanye ego ọzọ nke ọ kpọrọ Mavrodi Mundial Moneybox (MMM) ga-eme ugbua ha kwakọrọla lawa?
Ndị isi na-akwado MMM depụtara akwụkwọ na ọrụ ha ebiela n'ebighebi maka ọnwụ onye bidoro ya bụ Sergei Mavrodi.
Nkụchiobi gburu Mavrodi n'ụbọchị 26 nke ọnwa Maachị 2018, nke mere ndị otu ya ji kwụsị ọrụ.
Ka ọ nwụrụ, ndị mmadụ ezoghị ọnụ ha ka ha na-akwa akwa arịrị maka ego ha mefuru.
Gịnị ga-eme ego ndị mmadụ?
Mmechi MMM pụtara na ego ndị mmadụ efuola etu ahụ.
Kedụ ka anyị si mara nke a?
N'ime ndepụta ha tinyere na websaịt ha, ha kwuru na ndị mmadụ ma maka 'ọghọm' dị n'ime ya tupu ha ebido itinye ego ha.
Ha kwukwara na ha dọrọ ndị mmadụ aka na ntị, gosi na o so n'ihe ndị ị ga-ebinye aka oge ị na-achọ idenye aha gị na websaịt ha tupu ibido inye ma nweta ego.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmechi MMM
Ugbua Mavrodi nwụrụ, ndị mmadụ na-agba mbọ ichefu ego ha, n'agbanyeghị na ha nweburu ọbere olileanya na ego ha ga-emecha pụtara ha.
Ụfọdụ bụ ndị na-achọghị imetara ndị ego ha furu ebere