You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Winter Olympics: Lizzy Yarnold bụ onye mmerị asọmpi Skeleton
Emechaala asọmpị ọsọ skeleton winta olimpiks nke nwa Naịjirịa bụ Simidele Adeagbo so na ya.
Lizzy Yarnold nke Britain ritere ọlaedo, Jacqueline Loelling nke Germany ritere ọlaọcha, ebe Laura Deas nke Britain ritere ọlanchara.
Adeagbo bụ nwaaafọ Naịjirịa kpetere azụ n'oso nkwado anọ ha gbara tupu agbaa ọsọ ikpeazụ nke asọmpi a.
Ọtụtụ ndị Naịjirịa na-ekele Simidele Adeagbo maka mbọ ọgbara i so na asọmpị a.
Chete na Simi ji ọnwa anọ we mee nkwado asọmpị nke a.
Ndị otu Naịjirịa ọzọ na asọmpi oyi bụ winta olimpiks bụ Seun Adigun, Ngozi Onwumere na Akuoma Omeoga bụ ndị egwuregwu Bobsled.
Ha ga-ebido ọsọ nkwado ha n'ụbọchị iri abụọ n'ọnwa Febrụwarị.